Pular para o conteúdo
Publicidade

Levitikọs 1

Aja nsure ọkụ

1 Onyenwe anyị sitere nʼụlọ nzute ahụ kpọ Mosis oku, gwa ya sị, 2 "Gwa ụmụ Izrel sị, Mgbe onye ọbụla nʼime unu wetaara Onyenwe anyị onyinye, ka onyinye ga-eweta bụrụ anụ ụlọ si nʼetiti igwe ehi maọbụ igwe ewu na atụrụ.

3 " bụrụ na bụ onyinye aja nsure ọkụ1:3 Aja nsure ọkụ Ọ bụ ụzọ anụ atọ ka a na-eji achụ aja nsure ọkụ, nke a na-adaba dịka aka si ruo onye ahụ na-achụ aja. Nke mbụ bụ ehi, nke dịrị ndị ọgaranya. Ọzọkwa, bụ ewu na atụrụ, ma banyere ndị ogbenye, ihe ha ga-eweta bụ nnụnụ nduru ma ọ bụ kpalakwukwu. Lev 1:3,10,14; 5:7; 12:8; Luk 1:24 e wetara site nʼigwe ehi, bụ oke ehi nke na-enweghị ntụpọ ka ga-eweta. Nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ka ga-eweta ya, ka bụrụ ihe Onyenwe anyị ga-anabata. 4 Onye ahụ wetara ya ga-ebikwasị aka ya nʼisi anụ aja nsure ọkụ ahụ, a ga-anabata ya maka iji kpuchie mmehie ya. 5 Nwoke ahụ ga-egbu nwa oke ehi ahụ nʼihu Onyenwe anyị. Ụmụ ndị ikom Erọn, bụ ndị nchụaja ga-ewere ọbara ya fesa ya nʼakụkụ niile nke ebe ịchụ aja, nʼọnụ ụzọ e si abata ụlọ nzute ahụ. 6 ga-agba ehi aja nsure ọkụ ahụ akpụkpọ, bọkasịa ya ntakịrị ntakịrị. 7 Ụmụ Erọn, ndị nchụaja ga-etinye ọkụ nʼebe ịchụ aja ahụ, doo nkụ nʼusoro nʼelu ya. 8 Mgbe ahụ, ụmụ Erọn ndị nchụaja ga-atụkwasị akụkụ ehi ahụ niile, na isi ya, na abụba ya, nʼelu nkụ ahụ na-enwu ọkụ nʼebe ịchụ aja ahụ. 9 Ma a ga-asacha ihe ndị dị nʼime afọ ya, na ụkwụ ya mmiri. Onye nchụaja ga-akpọ ha niile ọkụ nʼebe ịchụ aja ahụ. bụ onyinye aja nsure ọkụ, onyinye e nyere site nʼọkụ nke dị ezi ụtọ nye Onyenwe anyị.

10 " bụrụ na onyinye aja nsure ọkụ ahụ si nʼigwe ewu na atụrụ, ga-abụrịrị mkpi maọbụ ebule na-enweghị nkwarụ. 11 Onye wetara ya ga-egbu ya nʼihu Onyenwe anyị nʼakụkụ ebe ịchụ aja chere ihu nʼugwu. Ụmụ ndị ikom Erọn, bụ ndị nchụaja, ga-efesa ọbara ya nʼakụkụ niile nke ebe ịchụ aja ahụ. 12 Mgbe nke a gasịrị, onye ahụ wetara ya, ga-abọ ya. Onye nchụaja ga-ewere akụkụ ya niile, na isi ya, na abụba ya tụkwasị ha nʼelu nkụ ahụ na-enwu ọkụ dị nʼebe ịchụ aja. 13 Ma ihe ndị dị nʼime afọ ya, na ụkwụ ya, ka onye ahụ ga-asa mmiri, tupu onye nchụaja eweta ha niile kpọọ ha ọkụ nʼebe ịchụ aja. bụ onyinye aja nsure ọkụ, onyinye e nyere site nʼọkụ, nke isisi ya dị ezi ụtọ nye Onyenwe anyị.

14 " bụrụ na onyinye na-enye Onyenwe anyị dịka aja nsure ọkụ bụ site nʼụmụ anụ ufe, ghaghị ịbụ nduru, maọbụ nwa kpalakwukwu. 15 Onye nchụaja ga-ewebata anụ ufe ahụ nʼebe ịchụ aja, tụbipụ isi ya, wụsa ọbara ya nʼakụkụ ebe ịchụ aja. 16 ga-ewepụ akpa nri ya, na ihe dị ya nʼime, tụnye ha nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke ebe ịchụ aja ahụ; ebe a na-ekposa ntụ. 17 ga-ejide nku ya abụọ nyawaa ha, ma gaghị anyakapụcha ha. Mgbe ahụ, onye nchụaja ahụ ga-akpọ ya ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja. bụ aja nsure ọkụ, onyinye e nyere site nʼọkụ, nke isisi ya dị Onyenwe anyị ezi ụtọ.

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.

Veja também