Pular para o conteúdo
Publicidade

Levitikọs 12

Ịdị ọcha nke nwanyị mụrụ nwa ọhụrụ

1 Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya, 2 "Nye ụmụ Izrel iwu ndị a sị ha, Mgbe nwanyị tụụrụ ime mesịa mụọ nwa nwoke, ga-abụ onye na-adịghị ọcha ụbọchị asaa, dịka o si adị mgbe nọ nʼadịghị ọcha nke nsọ ya nʼoge a kara aka. 3 Nʼụbọchị nke asatọ site nʼoge a mụrụ ya, a ga-ebi nwa nwoke ahụ ugwu. 4 Nʼime iri abalị atọ na atọ site nʼụbọchị nwanyị ahụ mụsịrị nwa ahụ, ga-anọkwa na-adịghị ọcha nke ọbara gbara ya. gaghị emetụ ihe dị nsọ aka, maọbụ banye nʼime ebe nsọ, ruo mgbe ụbọchị ime ya ka dị ọcha gasịrị. 5 Mgbe nwanyị dị ime mụrụ nwa nwanyị, ga-abụ onye nʼadịghị ọcha iri ụbọchị na anọ, dịka o si adị mgbe nọ na nsọ ya. ga-echere tutu iri ụbọchị isii agwụsịa, ime ya ka dị ọcha.

6 " Mgbe ụbọchị ịdị ọcha ya zuru, ma mụrụ nwa nwoke maọbụ nwa nwanyị, ga-ewetara onye nchụaja nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute otu nwa atụrụ gbara otu afọ maka onyinye aja nsure ọkụ, na otu nwa kpalakwukwu maọbụ otu nduru maka onyinye aja mmehie. 7 Onye nchụaja ga-anarakwa ha chee ha nʼihu Onyenwe anyị, chụọrọ ya aja ikpuchi mmehie. Mgbe ahụ ka ga-adị ọcha site nʼịsọ ọbara ya.

" Nke a bụ usoro iwu dịịrị nwanyị ọbụla mụrụ nwa nwoke, maọbụ nwa nwanyị. 8 bụrụ na aka erughị ya iweta nwa atụrụ, ga-eweta ụmụ kpalakwukwu abụọ, maọbụ ụmụ nduru abụọ. Otu ga-abụ maka aja nsure ọkụ, nke ọzọ ga-abụ maka aja mmehie. Onye nchụaja ga-ewere ha chụọrọ ya aja ikpuchi mmehie, ka dịkwa ọcha ọzọ.’ "

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.

Veja também