Pular para o conteúdo
Publicidade

Gênesis 45

5 Ma otu dị, ka ghara iwute unu, unu atakwala onwe unu ụta nʼihi orure unu rere m. Nʼihi na bụ nʼihi ichebe ndụ unu ka Chineke ji buru ụzọ zite m nʼebe a. 6 Oge ụnwụ agwụchabeghị. bụ ezie na afọ abụọ nke oke ụnwụ agafeela, ma fọdụrụ afọ ise ọzọ nʼihu, oge a na-agaghị akọ ihe ọbụla nʼala, maọbụ iwere ihe ọbụla nʼubi. 7 Chineke zitere m ka m buru ụzọ bịa nʼebe a nʼihi ime ka ndụ fọdụrụ unu nʼụwa, na ịzọpụta ndụ unu site nʼụzọ nnapụta dị oke egwu.

8 "Ya mere, bụghị unu zitere m nʼebe a, kama bụ Chineke. Ya onwe ya emeela ka m ghọọrọ Fero nna, na onyeisi ezinaụlọ ya niile, na onye na-achị ala Ijipt niile.

Veja também