Pular para o conteúdo
Publicidade

Gênesis 47

7 Josef kpọtara nna ya Jekọb, mee ka o guzo nʼihu Fero. Jekọb nọ nʼebe ahụ gọzie Fero. 8 Fero jụrụ Jekọb sị, "gbaala afọ ole ugbu a?"

9 Jekọb zara Fero sị ya: "Ebiela m dịka onye ọbịa narị afọ na iri afọ atọ. Ọnụọgụgụ afọ ndị a ehighị nne, ma ha jupụtara nʼahụhụ na nsogbu. Ma a nọrubeghị m ọnụọgụgụ afọ nna m ha gbara mgbe ha biri nʼụwa dịka ọbịa." 10 Jekọb gọziri Fero, site nʼihu ya pụọ.

11 Ya mere, Josef mere ka nna ya na ụmụnne ya biri nʼala Ijipt. O nyere ha ala kachasị mma nʼala ahụ na mpaghara Ramesis, dịka Fero nyere nʼiwu. 12 Josef nyere nna ya na ụmụnne ya na ezinaụlọ nna ya nri dịka ọnụọgụgụ nke ụmụ ha si dị.

Veja também