6 Nʼihi na onye Onyenwe anyị hụrụ nʼanya ka ọ na-abara mba.
Ọ bụkwa onye ọ nabatara dị ka nwa ya, ka ọ na-apịa ụtarị."12:6 Ilu 3:11,12
7 Tachie obi, mụta ihe site nʼahụhụ. Nʼihi na Chineke na-emeso unu mmeso dị ka nna ọbụla hụrụ ụmụ ya nʼanya si emeso ha mmeso. Nwata ọbụla adịghị nke nna ya na-adịghị abara mba.