Mkpesa Habakuk
2 Onyenwe anyị, ruo ole mgbe ka m ga-anọgide na-eti mkpu
ma ị dịghị ege ntị?
Ruo ole mgbe ka m ga na-etiku gị na-asị, "Ihe ike, ihe ike!"
ma ị dịghị azọpụta?
3 Nʼihi gịnị ka i ji eme m ka m na-ahụ ihe ọjọọ?
Gịnị mere i ji anagide mmegbu?
Mbibi na ihe ike dị nʼihu m,
na ịlụ ọgụ, na esemokwu jupụtakwara ebe niile.