21 Mata sịrị Jisọs, "Onyenwe m, a sị na ị nọ nʼebe a, nwanne m nwoke agaraghị anwụ. 22 Ma ugbu a, amara m na Chineke ga-enye gị ihe ọbụla ị rịọrọ."
23 Jisọs sịrị ya, "Nwanne gị nwoke ga-ebili ọzọ."
24 Mata sịrị ya, "Amara m na ọ ga-ebili ọzọ nʼụbọchị mbilite nʼọnwụ nʼoge ikpeazụ."
25 Jisọs gwara ya, "Mụ onwe m bụ mbilite nʼọnwụ na ndụ. Onye ọbụla kwere na m, a sịkwarị na ọ nwụrụ anwụ, ọ ga-adị ndụ ọzọ. 26 Ma onye ọbụla dị ndụ nke na-ekwere na m agaghị anwụ. Ị kwere nke a?"
27 Ọ sịrị ya, "E, Onyenwe m, ekwere m na ị bụ Kraịst ahụ, Ọkpara Chineke, onye ga-abịa nʼụwa."