Jisọs abịa na Jerusalem dị ka Eze
12 Nʼechi ya oke igwe mmadụ ahụ ndị bịara mmemme nụrụ na Jisọs na-abịa Jerusalem. 13 Ha weere igu nkwụ pụọ izute ya na-eti mkpu,
"Hozanna!"
"Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị!"12:13 Abụ 118:25,26
"Ngọzị dịrị eze Izrel!"
14 Jisọs hụrụ nwa ịnyịnya ibu, nọkwasị nʼelu ya, dị ka e dere ya,
15 "Atụla egwu, gị ada Zayọn!
Lee, eze gị ka ọ na-abịa.
Ọ nọkwasịrị nʼelu nwa ịnyịnya ibu."12:15 Zek 9:9
16 Na mbụ ndị na-eso ụzọ ya aghọtaghị ihe ndị a niile. Ma mgbe e nyesịrị Jisọs otuto, ka ha chetara na-edererị ihe ndị a banyere ya, na e mekwara ya rịị ihe ndị a.
17 Igwe mmadụ ahụ bụ ndị ya na ha nọ mgbe o si nʼili kpọpụta Lazarọs, mee ka o sị nʼọnwụ bilie, gara nʼihu na-agba ama ya. 18 Ọtụtụ mmadụ pụrụ izute ya nʼihi na ha nụrụ akụkọ ọrụ ihe ịrịbama niile ọ rụrụ. 19 Ya mere, ndị Farisii sịrịtara onwe ha, "Unu ahụla na o nweghị ihe unu pụrụ ime, leenụ ka ụwa niile na-eso ya."