Pular para o conteúdo
Publicidade

Jọn 17

Ekpere Jisọs maka ndị niile kwere ekwe

20 "Ekpeghị m ekpere a nʼihi ndị a naanị. Kama ana m ekpekwa ekpere a nʼihi ndị niile ga-ekwere na mụ, site nʼokwu ha. 21 Ka ha niile bụrụ otu, Nna, dị ka nọ nʼime m mụ a nọrọ nʼime gị. Ka ha nọrọkwa nʼime anyị ka ụwa kwere na bụ gị zitere m. 22 Enyere m ha otuto nke i nyere m, ka ha bụrụ otu dị ka anyị onwe anyị si bụrụ otu; 23 Mụ onwe m nʼime ha, gị onwe gị nʼime m. Ka e mee ka ha bụrụ otu nʼụzọ zuruoke, ka ụwa matakwa na bụ gị zitere m, na hụkwara ha nʼanya dị ka si hụ m nʼanya.

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.

Veja também