23 Mgbe ndị agha kpọgidechara Jisọs nʼobe, ha kere uwe ya ụzọ anọ. Onye ọbụla nʼime ha nwetara otu ụzọ. Ha chịrị uwe mwụda ya nke a na-adụghị adụ, kama a kpara ya akpa site nʼelu ya ruo nʼala ya.
24 Ha gwarịtara onwe ha, "Ka anyị hapụnụ ịdọka ya, kama ka anyị fee nza lee onye ọ ga-adanyere i were ya."
Nke a bụ iji mezuo ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ,
"Ha kere uwe m nʼetiti onwe ha,
feekwa nza banyere uwe mwụda m."19:24 Abụ 22:18
Nke a bụ ihe ndị agha ahụ mere.
25 Nne ya, nwanne ya nwanyị, bụ Meri nwunye Klopas, na Meri Magdalin guzo nso nʼakụkụ obe Jisọs. 26 Mgbe Jisọs hụrụ nne ya na onye na-eso ụzọ ya ọ hụrụ nʼanya ka o guzo nʼakụkụ ya, ọ sịrị nne ya, "Nwanyị lee nwa gị nwoke." 27 Ọ sịrị onye ahụ nke na-eso ụzọ ya, "Lee nne gị." Site nʼoge ahụ, onye ahụ na-eso ụzọ ya kpọọrọ ya laa nʼụlọ nke ya.