Pular para o conteúdo
Publicidade

Jọn 2

Mmemme Ngabiga

13 Mgbe mmemme oriri Ngabiga nke ndị Juu na-abịaru nso, Jisọs gara Jerusalem. 14 Nʼime ụlọnsọ ukwu, hụrụ ndị na-ere ehi, na atụrụ na nduru. Hụkwa ndị nọdụrụ na tebul na-agbanwe ego. 15 Ya mere, o jiri eriri mere ụtarị chụpụsịa ndị niile nọ na-ere ahịa nʼụlọnsọ ukwu ahụ, tinyekwara ehi na atụrụ ha. kwafusịrị mkpụrụ ego ndị ahụ na-agbanwe ego, kpugharịakwa tebul ha ihu. 16 sịrị ndị ahụ na-ere nduru, "Wepụnụ ihe ndị a nʼebe a. Kwụsịnụ ime ụlọ Nna m ka bụrụ ebe a na-azụ ahịa." 17 Ndị na-eso ụzọ ya chetara na e dere ya rịị nʼakwụkwọ nsọ, "Ihe banyere ụlọ gị na-anụ m ọkụ nʼobi."2:17 Abụ 69:9

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.

Veja também