14 Nʼoge a, ọ tụgharịrị hụ ka Jisọs guzo nʼebe ahụ. Ma ọ mataghị na ọ bụ Jisọs.
15 Jisọs sịrị ya, "Nwanyị, gịnị mere iji ebe akwa? Onye ka ị na-achọ?"
Ebe o chere na ọ bụ onye na-elekọta ogige ahụ, ọ sịrị ya, "Nna anyị ukwu, ọ bụrụ na ọ bụ gị bupụrụ ya, gwa m ebe i debere ya ka m gaa buru ya."
16 Jisọs sịrị ya, "Meri."
Ọ tụgharịrị tie mkpu nʼolu Hibru sị ya, "Raboni!" (nke pụtara "Onye nkuzi.)"