Pular para o conteúdo
Publicidade

João 20

Jisọs egosi Tọmọs onwe ya

24 Ma Tọmọs (onye a na-akpọ Didimọs), otu nʼime ndị ozi iri na abụọ ahụ, anọghị ya mgbe Jisọs bịara. 25 Ya mere, ndị ọzọ na-eso ụzọ ya gwara ya, "Anyị ahụla Onyenwe anyị!"

Ma sịrị ha, "bụ naanị mgbe m jiri anya m hụ ebe ahụ ntu kpọpuru ya aka, tinye mkpịsịaka m nʼapa ntu ndị ahụ, ma tinyekwa aka m nʼakụkụ ya ebe ahụ a mara ya ùbe, ka m ga-ekwere."

26 Mgbe abalị asatọ gasịrị, ndị na-eso ụzọ ya zukọtara ọzọ. Ugbu a Tọmọs nọkwa nʼetiti ha. Nʼagbanyeghị na e mechisịrị ụzọ niile, Jisọs batara guzo nʼetiti ha sị ha, "Udo dịrị unu." 27 Mgbe ahụ sịrị Tọmọs, "Rụnye mkpịsịaka gị nʼebe a, leekwa aka m abụọ. Wepụta aka gị tinyekwa nʼakụkụ m. Abụla onye na-enweghị okwukwe, kama kwere."

28 Tọmọs zara sị ya, "Onyenwe m na Chineke m!"

29 Ma Jisọs sịrị ya, "I kweere nʼihi na hụla m? Ma ngọzị dịrị ndị na-ahụghị ma kwere."

Veja também