Jisọs egosi Tọmọs onwe ya
24 Ma Tọmọs (onye a na-akpọ Didimọs), otu nʼime ndị ozi iri na abụọ ahụ, anọghị ya mgbe Jisọs bịara. 25 Ya mere, ndị ọzọ na-eso ụzọ ya gwara ya, "Anyị ahụla Onyenwe anyị!"
Ma ọ sịrị ha, "Ọ bụ naanị mgbe m jiri anya m hụ ebe ahụ ntu kpọpuru ya aka, tinye mkpịsịaka m nʼapa ntu ndị ahụ, ma tinyekwa aka m nʼakụkụ ya ebe ahụ a mara ya ùbe, ka m ga-ekwere."
26 Mgbe abalị asatọ gasịrị, ndị na-eso ụzọ ya zukọtara ọzọ. Ugbu a Tọmọs nọkwa nʼetiti ha. Nʼagbanyeghị na e mechisịrị ụzọ niile, Jisọs batara guzo nʼetiti ha sị ha, "Udo dịrị unu." 27 Mgbe ahụ ọ sịrị Tọmọs, "Rụnye mkpịsịaka gị nʼebe a, leekwa aka m abụọ. Wepụta aka gị tinyekwa nʼakụkụ m. Abụla onye na-enweghị okwukwe, kama kwere."
28 Tọmọs zara sị ya, "Onyenwe m na Chineke m!"
29 Ma Jisọs sịrị ya, "I kweere nʼihi na ị hụla m? Ma ngọzị dịrị ndị na-ahụghị ma kwere."