Pular para o conteúdo
Publicidade

João 21

Jisọs na ọrụ ebube nke igbute azụ

1 Mgbe ihe ndị a gasịrị, Jisọs gosiri ndị na-eso ụzọ ya onwe ya ọzọ. O mere nke a nʼakụkụ osimiri nke Tiberịas,21:1 Maọbụ, Galili lee otu o si mee. 2 Ụfọdụ nʼime ndị na-eso ụzọ ya nọkọrọ otu ebe. Ndị a bụ Saimọn Pita na Tọmọs (onye a na-akpọ Didimọs), na Nataniel, onye Kena nke Galili na ụmụ Zebedi, na mmadụ abụọ ndị ọzọ bụkwa ndị ozi ya. 3 Saimọn Pita sịrị ha, "Ana m aga igbu azụ." Ha sịrị, "Anyị ga-eso gị." Ha biliri gaa, banye nʼime ụgbọ mmiri. Ma nʼabalị ahụ niile ha egbuteghị ihe ọbụla.

4 Mgbe chi na-abọ Jisọs guzoro nʼakụkụ mmiri. Ma ndị na-eso ụzọ ya amataghị na bụ Jisọs.

5 Jisọs sịrị ha, "Ụmụntakịrị, unu gbutere azụ ọbụla?"

Ha zara ya, "Mba."

6 gwara ha, "Wụnyenụ ụgbụ unu nʼakụkụ aka nri nke ụgbọ. Unu ga-egbutekwa azụ." Mgbe ha mere nke a, ha enwekwaghị ike ịdọpụta ụgbụ ha, nʼihi ọtụtụ azụ nke dị nʼime ya.

7 Mgbe ahụ onye ahụ na-eso ụzọ ya Jisọs hụrụ nʼanya gwara Pita, "bụ Onyenwe anyị!" Ngwangwa Saimọn Pita nụrụ na "bụ Onyenwe anyị," yiiri uwe ya (nʼihi na gba ọtọ), wụba nʼime mmiri ahụ. 8 Ndị ọzọ ndị na-eso ụzọ ya bịara nʼụgbọ mmiri nta ahụ, na-adọpụta ụgbụ ha nke azụ juru nʼime ya, nʼihi na ha nọ nso nʼala ihe dị ka narị nzọ ụkwụ na ise.21:8 Maọbụ, narị kubit abụọ 9 Mgbe ha pụtara nʼelu ala, ha hụrụ ọkụ a kwanyere, nke a hụkwasịrị azụ nʼelu ya na ogbe achịcha.

10 Jisọs gwara ha, "Wetanụ ụfọdụ nʼime azụ ndị ahụ unu gbutere ugbu a." 11 Saimọn Pita pụrụ gaa dọgota ụgbụ azụ ahụ nʼelu ala. Ihe juru ya bụ azụ ndị ukwuu nke ọnụọgụgụ ya dị narị na iri ise na atọ. Ma ụgbụ ahụ adọwaghị nʼagbanyeghị na azụ juru nʼime ya.

Veja também