Ndị na-eso ụzọ ya lọghachikwutere ya
27 Nʼoge ahụ ndị na-eso ụzọ ya lọghachitara. Ọ gbagwojukwara ha anya nke ukwuu ịhụ na ya na nwanyị na-ekwurịta okwu. Ma o nweghị onye nʼime ha jụrụ nwanyị ahụ sị, "Gịnị ka ị chọrọ?" ma ọ bụkwanụ, "Gịnị kpatara gị na ya ji na-ekwurịta okwu?"