Abụ Zekaraya
67 E mere ka Zekaraya bụ nna ya jupụta na Mmụọ Nsọ. O buru amụma sị,
68 "Ngọzị dịrị Onyenwe anyị bụ Chineke nke Izrel,
nʼihi na ọ bịala leta ma gbapụtakwa ndị nke ya.
69 O welielara anyị Onye nzọpụta
site nʼụlọ odibo ya bụ Devid.
70 (Dị ka o kwuru na mgbe ochie, site nʼọnụ ndị amụma ya dị nsọ).
71 Na ọ ga-azọpụta anyị site nʼaka ndị iro anyị
na sitekwa nʼaka ndị niile kpọrọ anyị asị.
72 O meere ndị nna nna anyị ha ebere
site nʼicheta ọgbụgba ndụ ya dị nsọ.
73 Iyi nke ọ ṅụụrụ nna anyị bụ Ebraham, kwekwa nkwa:
74 Na ọ ga-anapụta anyị site nʼaka ndị iro anyị,
nyekwa anyị ike ife ya ofufe na-atụghị egwu.
75 Nʼịdị nsọ na ezi omume nʼihu ya ụbọchị niile nke ndụ anyị.
76 "Ma gị nwa m, a ga-akpọ gị onye amụma nke Onye kachasị ihe niile elu;
nʼihi na ị ga-aga nʼihu Onyenwe anyị kwadoro ya ụzọ.
77 Ime ka ndị nke ya nwee amamihe nke nzọpụta
site na ịgbaghara mmehie ha.
78 Nʼihi oke obi ebere Chineke anyị,
nke ọwụwa anyanwụ ga-ewetara anyị site nʼigwe.
79 Ka ọ chakwasị ndị bi nʼọchịchịrị
na nʼonyinyo nke ọnwụ,
na iduzi ụkwụ anyị nʼụzọ nke udo."