Jisọs agaa nʼụlọnsọ ukwuu
41 Nʼafọ niile, ndị mụrụ ya na-aga Jerusalem nʼihi Mmemme Ngabiga. 42 Mgbe o ruru afọ iri na abụọ, ha gara maka mmemme dị ka omenaala si dị.2:42 Ọ bụ naanị Luk dere banyere Jisọs isonyere ndị mụrụ ya gaa maka mmemme a. 43 Mgbe e mesịrị mmemme ahụ, ka ndị mụrụ ya na-alaghachi, nwata ahụ bụ Jisọs nọdụrụ na Jerusalem. Ndị ha amataghị na o soghị ha na-alọta. 44 Ha chere na o sonyere nʼetiti njem. Ha gara ije otu ụbọchị tupu ha a malite ịchọ ya nʼetiti ndị ikwu na ibe, na ndị enyi ha. 45 Ma mgbe ha na-ahụghị ya, ha laghachiri Jerusalem na-achọkwa ya. 46 Ka ụbọchị atọ gasịrị, ha hụrụ ya nʼụlọnsọ ukwu ebe ọ nọdụrụ nʼetiti ndị ode akwụkwọ, na-ege ha ntị na-ajụkwa ha ajụjụ. 47 Nghọta na ọsịsa ya juru ndị niile nụrụ okwu ya anya. 48 Mgbe ndị mụrụ ya hụrụ ya, ọ tụrụ ha nʼanya, ma nne ya sịrị ya, "Nwa m, gịnị mere i ji mesoo anyị mmeso dị otu a? Mụ na nna gị nọ na-achọgharị gị?"
49 Ọ jụrụ ha sị, "Gịnị mere unu ji na-achọ m? Unu amaghị na aghaghị m ịnọ nʼụlọ Nna m?" 50 Ma ha aghọtaghị ihe ọ gwara ha.
51 Mgbe ahụ, o sooro ha laghachi Nazaret ma na-erubekwara ha isi. Ma nne ya dobere ihe ndị a niile nʼobi ya. 52 Jisọs na-aga nʼihu nʼamamihe na ogologo, ya na ihuọma nʼebe Chineke na nke mmadụ nọ.