Pular para o conteúdo
Publicidade

Luk 2

Jisọs agaa nʼụlọnsọ ukwuu

41 Nʼafọ niile, ndị mụrụ ya na-aga Jerusalem nʼihi Mmemme Ngabiga. 42 Mgbe o ruru afọ iri na abụọ, ha gara maka mmemme dị ka omenaala si dị.2:42 Ọ bụ naanị Luk dere banyere Jisọs isonyere ndị mụrụ ya gaa maka mmemme a. 43 Mgbe e mesịrị mmemme ahụ, ka ndị mụrụ ya na-alaghachi, nwata ahụ bụ Jisọs nọdụrụ na Jerusalem. Ndị ha amataghị na o soghị ha na-alọta. 44 Ha chere na o sonyere nʼetiti njem. Ha gara ije otu ụbọchị tupu ha a malite ịchọ ya nʼetiti ndị ikwu na ibe, na ndị enyi ha. 45 Ma mgbe ha na-ahụghị ya, ha laghachiri Jerusalem na-achọkwa ya. 46 Ka ụbọchị atọ gasịrị, ha hụrụ ya nʼụlọnsọ ukwu ebe nọdụrụ nʼetiti ndị ode akwụkwọ, na-ege ha ntị na-ajụkwa ha ajụjụ. 47 Nghọta na ọsịsa ya juru ndị niile nụrụ okwu ya anya. 48 Mgbe ndị mụrụ ya hụrụ ya, tụrụ ha nʼanya, ma nne ya sịrị ya, "Nwa m, gịnị mere i ji mesoo anyị mmeso dị otu a? Mụ na nna gị nọ na-achọgharị gị?"

49 jụrụ ha sị, "Gịnị mere unu ji na-achọ m? Unu amaghị na aghaghị m ịnọ nʼụlọ Nna m?" 50 Ma ha aghọtaghị ihe gwara ha.

51 Mgbe ahụ, o sooro ha laghachi Nazaret ma na-erubekwara ha isi. Ma nne ya dobere ihe ndị a niile nʼobi ya. 52 Jisọs na-aga nʼihu nʼamamihe na ogologo, ya na ihuọma nʼebe Chineke na nke mmadụ nọ.

Veja também