Jisọs emee ka ebili mmiri dajụọ
22 Otu ụbọchị, ya na ndị na-eso ụzọ ya banyere nʼụgbọ mmiri, ọ sịrị ha, "Ka anyị gafee nʼofe nke ọzọ nke osimiri." Nke a mere ha ji nụpụ ụgbọ, 23 ma mgbe ha na-aga, ọ rahụrụ ụra. Oke ifufe malitere ife nʼelu ọdọ mmiri ahụ, nke mere na mmiri na-awụbanye nʼime ụgbọ ha, mee ka ha nọrọ nʼoke nsogbu.
24 Ha gara kpọtee ya na-eti mkpu, "Nna anyị ukwu! Nna anyị ukwu! Lee na anyị nʼala nʼiyi!"
O biliri, baara ifufe na ebili mmiri ahụ mba. Ha dara jụụ, ebe niile dekwara jii. 25 Ọ sịrị ha, "Ebee ka okwukwe unu dị?"
Ha ji oke egwu na oke iju anya jụrịta onwe ha sị, "Onye bụ onye a? Ọ na-enye ọ bụladị ifufe na ebili mmiri iwu, ha na-aṅakwa ya ntị."