Pular para o conteúdo
Publicidade

Lucas 8

43 dị otu nwanyị nʼetiti ha nke nọrịị na-arịa ọrịa oruru ọbara afọ iri na abụọ, onye mefuru ihe niile o ji nʼaka ndị dibịa, ma dịghị onye nwere ike ịgwọ ya. 44 O sitere nʼazụ ya metụ ọnụ uwe ya aka. Ngwangwa, ọrịa oruru ọbara ahụ kwụsịkwara.

45 Jisọs sịrị, "Onye metụrụ m aka?"

Mgbe na-enweghị onye pụtara kwuo sị na bụ ya. Pita gwara ya sị, "Nna anyị ukwu, igwe mmadụ gbara gị gburugburu na-adakwasịkwa gị."

46 Ma Jisọs sịrị, "Otu onye metụrụ m aka; amatara m na ike esitela nʼime m pụọ."

47 Mgbe nwanyị ahụ hụrụ na dịkwaghị ihe o nwere ike ime iji zoo onwe ya, o ji ịma jijiji bịa daa nʼụkwụ ya. Nʼihu mmadụ niile, kọrọ ihe mere o ji metụ ya aka na otu e sị gwọọ ya nʼotu ntabi anya. 48 gwara ya sị, "Ada m nwanyị, okwukwe gị agwọọla gị. Laa nʼudo."

Veja também