Pular para o conteúdo
Publicidade

Levítico 5

1 " bụrụ na mmadụ ọbụla emehie nʼihi na jụrụ ikwupụta mgbe nụrụ ọkwa amaara nʼọha maka ịgba ama banyere ihe hụrụ maọbụ ihe maara, bụ onye ikpe mara.

2 " Onye na-amaghị ama metụ ihe rụrụ arụ aka, dịka ozu anụ ọbụla iwu megidere, maọbụ anụ ụlọ, maọbụ anụ ọhịa, maọbụ anụ ọbụla na-akpụ akpụ nʼala. ghọọla onye rụrụ arụ, na onye ikpe mara. 3 Ma bụrụ na ha emetụ ihe ọbụla rụrụ arụ si nʼahụ mmadụ pụta aka, ihe ọbụla ga-eme ya ka hapụ ịdị ọcha, bụ ezie na ha amaghị na bụ ihe rụrụ arụ, mgbe matara ya, ga-abụ onye ikpe mara. 4 bụrụ na mmadụ a ṅụọ iyi nzuzu, nke ga-akwagide ya ime ihe ọbụla maọbụ ihe dị mma, maọbụ ihe dị njọ, mgbe onye ahụ ghọtara na bụ iyi nzuzu ka ṅụrụ, bụrụla onye ikpe mara. 5 Onye ọbụla sitere nʼụzọ dị otu a bụrụ onye ikpe mara, ga-ekwupụta mmehie ya,5:5 Ọnụ 5:7 dịka o si dị. 6 ga-ewetara Onyenwe anyị nne atụrụ, maọbụ nne ewu site nʼigwe ewu na atụrụ, dịka aja ikpe ọmụma maka mmehie ha mere. Onye nchụaja ga-achụrụ ha aja mkpuchi mmehie maka mmehie ha.

7 " bụrụ na o nweghị ike iweta atụrụ, ga-ewetara Onyenwe anyị nduru abụọ, maọbụ kpalakwukwu abụọ, dịka ihe ikpe ọmụma mmehie ha. Otu nʼime nnụnụ ndị a ga-abụ maka aja mmehie, nke ọzọ ga-abụ maka aja nsure ọkụ. 8 ga-eweta ha nye onye nchụaja. Onye ga-ewere nnụnụ nke mbụ chụọ aja mmehie. ga-atụbipụ olu ya, kama gaghị ekewapụcha isi nnụnụ ahụ site nʼahụ ya. 9 ga-efesa ụfọdụ ọbara aja mmehie ahụ nʼakụkụ ebe ịchụ aja, ma ọbara fọdụrụ ka ga-awụsa nʼụkwụ ala ala ebe ịchụ aja. Nke a ga-abụ aja mmehie. 10 Onye nchụaja ga-eji nnụnụ nke ọzọ chụọ aja nsure ọkụ. ga-agbaso usoro e debere maka ịchụ aja nsure ọkụ.5:10 Lev 1:14-17 ga-ekpuchikwara ha mmehie ha mere. A ga-agbagharakwa ha.

11 " bụrụ na onye ahụ enweghị ike iweta nduru abụọ, maọbụ kpalakwukwu abụọ, ga-eweta iko ọka asaa a kwọrọ nke ọma ka bụrụ onyinye aja mmehie. gaghị etinye ya mmanụ oliv na ụda na-esi isi ụtọ, nʼihi na bụ aja mmehie. 12 Ha ga-ewere ya bịakwute onye nchụaja, onye ga-ekporo nke ga-eju ya aka ya dịka oke ncheta. Kpọọ ya ọkụ nʼebe ịchụ aja nke onyinye nsure ọkụ e chere nʼihu Onyenwe anyị. Nke a ga-abụkwa aja mmehie ya. 13 Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-achụrụ ya aja ikpuchi mmehie ya niile. A ga-agbagharakwa ya. Ụtụ ọka fọdụrụ ga-abụ nke onye nchụaja, dịka e si mee ya nʼaja onyinye mkpụrụ ọka.’ "

Aja ikpe ọmụma

14 Onyenwe anyị gwara Mosis sị, 15 "Mgbe onye ọbụla sitere na-amaghị ama mehie, merụọ ihe nsọ niile nke Onyenwe anyị, bụrụ onye nke nʼekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị. ga-ewetara Onyenwe anyị otu ebule na-enweghị ntụpọ site nʼigwe anụ, dịka ọnụahịa ya si dị nʼọlaọcha, nʼusoro shekel nke ebe nsọ.5:15 Ya bụ ọnụ ego, dịka ndị ikpe kpebiri ya. bụ aja ikpe ọmụma. 16 ga-akwụghachikwa ụgwọ ihe nsọ ndị ahụ niile nke na-emezughị. ga-atụkwasị otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ọnụahịa ya nʼelu ya, were ha niile nye onye nchụaja. Onye nchụaja ahụ ga-ewere ebule ahụ na ihe ndị a chụọrọ ya aja mkpuchi mmehie, nʼihi ikpe ọmụma ya. A ga-agbagharakwa ya.

17 "Ma bụrụ na mmadụ ọbụla emehie, mee ihe ọbụla megidere iwu ọbụla Onyenwe anyị nyere, bụ ezie na e mere mmehie a na-amaghị ama, ma ikpe mara ha, ga-atakwa ahụhụ soo ya. 18 ga-ewetara onye nchụaja ihe aja ikpe ọmụma nke bụ otu ebule na-enweghị ntụpọ site nʼigwe anụ, nke ọnụahịa ga-abụ ihe o ruru. Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-achụrụ ya aja mkpuchi mmehie nʼihi ihe ọjọọ o mere na-amaghị ama. A ga-agbaghara ya mmehie ya. 19 bụ aja ikpe ọmụma, nʼihi na onye mehiere megide Onyenwe anyị ka bụ."

Veja também