Ọgwụgwọ Batimiọs onyeisi
46 Mgbe ha ruru Jeriko, dị ka Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya na ọtụtụ igwe mmadụ sitere nʼobodo Jeriko na-apụ, otu nwoke kpuru ìsì aha ya bụ Batimiọs (aha ya pụtara "nwa nwoke Timiọs"), onye arịrịọ nọdụrụ ala nʼakụkụ ụzọ. 47 Mgbe ọ nụrụ na ọ bụ Jisọs onye Nazaret na-agafe, o bidoro iti mkpu na-asị, "Jisọs, nwa Devid, meere m ebere!"
48 Ọtụtụ mmadụ bara ya mba ka o mechie ọnụ. Ma ọ nọgidesịrị ike na-eti mkpu na-asị, "Nwa Devid, meere m ebere!"
49 Jisọs kwụsịrị kwuo sị, "Kpọọnụ ya."
Ya mere ha kpọrọ onye ìsì ahụ, sị ya, "Mesaa ihu gị bilie nʼụkwụ gị, ọ na-akpọ gị." 50 Ọ tufuru uwe mwụda ya, wulie nʼụkwụ ya, bịakwute Jisọs.
51 Jisọs sịrị ya, "Gịnị ka ị chọrọ ka m meere gị?"
Onye ìsì ahụ sịrị ya, "Onye ozizi m, achọrọ m ka m hụ ụzọ."
52 Jisọs sịrị ya, "Laa, okwukwe gị azọpụtala gị." Nʼotu oge ahụ, o bidoro ịhụ ụzọ, sorokwa ya gawa nʼụzọ ahụ.