Osisi fiig a bụrụ ọnụ
12 Nʼechi ya, mgbe ha si Betani na-apụta, agụụ gụrụ ya. 13 Site nʼebe dị anya, ọ hụrụ otu osisi fiig nke nwere akwụkwọ ndụ. Mgbe ọ bịaruru osisi ahụ nso, ọ gagharịrị nʼukwu ya niile ma ọ ga-achọta mkpụrụ nʼelu ya, ma ọ hụghị mkpụrụ ọbụla, naanị akwụkwọ ndụ, nʼihi na oge a abụghị oge osisi a ji amị mkpụrụ. 14 Mgbe ahụ, ọ gwara osisi ahụ sị, "Ka mmadụ ọbụla ghara iri mkpụrụ sitere na gị ruo ebighị ebi." Ndị na-eso ụzọ ya nụrụ mgbe o kwuru okwu a.