61 Ma ọ gbakwara nkịtị, ọ zaghị ihe ọbụla.
Ọzọkwa, onyeisi nchụaja jụrụ ya sị, "Ị bụ Kraịst, Ọkpara Onye a gọziri agọzi?"
62 Jisọs sịrị, "Abụ m ya, unu ga-ahụkwa Nwa nke Mmadụ ka ọ na-anọdụ ala nʼaka nri nke Onye ji ike niile, na-abịakwa nʼigwe ojii nke eluigwe."