Ọgwụgwọ onye aka ya kpọnwụrụ
1 Nʼoge ọzọ, ọ banyere nʼụlọ ekpere, otu nwoke aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ nọkwa nʼebe ahụ. 2 Ụfọdụ ha nọ na-achọ ụzọ ha ga-esi boo ya ebubo, ya mere ha lekwasịrị ya anya ịhụ ma ọ ga-agwọ ya ọrịa nʼụbọchị izuike. 3 Ma ọ gwara nwoke ahụ aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ sị, "Bilie guzoro nʼetiti ebe a."
4 Mgbe ahụ ọ jụrụ ha sị, "Olee nke ziri ezi nʼiwu ime nʼụbọchị izuike: ọ bụ ime ezi ihe ka ọ bụ ime ihe ọjọọ, ịzọpụta ndụ ka ọ bụ ịla ndụ nʼiyi?" Ma ha gbachiri nkịtị.
5 O lere ha anya nʼiwe, o wutere ya nʼihi na obi ha kpọrọ nkụ. Ọ sịrị nwoke ahụ, "Setịpụ aka gị." O setịpụrụ aka ya, aka ya dizikwara nke ọma.