22 Ma otu nʼime ndịisi ụlọ ekpere nke aha ya bụ Jairọs bịara, mgbe ọ hụrụ ya, ọ dara nʼala nʼụkwụ ya, 23 rịọsie ya arịrịọ ike sị, "Ada m nwanyị nke nta nọ nʼọnụ ọnwụ ugbu a. Biko, bịa ka ị bikwasị ya aka gị ka agwọ ya, ka ọ dịkwa ndụ." 24 Ya mere, Jisọs soro ya gawa.
Oke igwe mmadụ sokwa ya na-akpagbu ya.