Publicidade

Mateus 24

29 "Ngwangwa mgbe mkpagbu nke ụbọchị ndị ahụ niile gabigasịrị,

" anyanwụ ga-agba ọchịchịrị.

Ọnwa agaghị enyekwa ìhè,

kpakpando ga-esi na mbara eluigwe daa,

ike niile nke eluigwe ga-ama jijiji. 24:29 Aịz 13:10; 34:4

30 "Nʼoge ahụ akara ngosi nke Nwa nke Mmadụ ga-apụta ihe na mbara eluigwe. Agbụrụ niile nke ụwa ga-anọkwa na-eru ụjụ. Ha ga-ahụ Nwa nke Mmadụ ka na-abịa nʼigwe ojii, nʼike nakwa oke ebube. 31 ga-ewerekwa olu opi ike zipụ ndị mmụọ ozi ka ha gaa kpọkọtaa ndị niile a họpụtara site nʼakụkụ anọ niile nke eluigwe na ụwa.

Veja também

Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-07-05_19-25-13-