Ekpere Jisọs na Getsameni
36 Mgbe Jisọs bịara nʼogige ahụ a na-akpọ Getsameni, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya sị ha, "Nọdụnụ nʼebe a ka m gaa nʼihu nke nta kpee ekpere." 37 Ọ kpọọrọ Pita tinyere onwe ya, na ụmụ Zebedi abụọ. Ọ malitere inwe obi mwute nʼime onwe ya. Obi malitekwara ịlọ ya mmiri. 38 Mgbe ahụ ọ gwara ha sị, "Ọ na-ewute mkpụrụobi m nke ukwuu ruo nʼọnụ ọnwụ. Nọgidenụ nʼebe a soro m na-eche nche."
39 Ọ gara nʼihu nke nta daa, kpuo ihu ya nʼala, kpee ekpere sị, "Nna m, ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee, napụ m iko a. Ma ọ bụghị ka e mee uche m, kama ka e mee uche gị."
40 Ya mere, ọ bịakwutere ndị na-eso ụzọ ya, hụ ha ka ha na-arahụ ụra. Ọ sịrị Pita, "Ọ bụ na unu enweghị ike i soro m chee nche, ọ bụladị otu awa? 41 Na-echenụ nche, na-ekpekwa ekpere, ka unu ghara ịba nʼọnwụnwa.26:41 Maọbụ, nwalee Nʼihi na mmụọ dị na njikere ma anụ ahụ adịghị ike."
42 Ọ laghachiri azụ nke ugboro abụọ kpeekwa ekpere sị, "Nna m, ọ bụrụ na iko a agaghị agabiga ma ọ bụghị na m ṅụrụ ya, ka e mee uche gị."
43 Ọ lọghachikwara ọzọ hụkwa ka ha na-arahụ ụra, nʼihi na anya ha dị arọ. 44 Ọ hapụrụ ha ọzọ gaa kpee ekpere nke ugboro atọ, na-ekwukwa otu okwu ahụ.
45 Mgbe ọ lọghachikwutere ndị na-eso ụzọ ya, ọ sịrị ha, "Unu ka nọ na-arahụ ụra, na-ezukwa ike? Lee, oge awa ahụ abịala, a rarala Nwa nke Mmadụ nye nʼaka ndị mmehie. 46 Bilienụ ka anyị gawa. Lee, onye ahụ na-arara m nye na-abịa!"