Pular para o conteúdo
Publicidade

Matiu 27

63 Ha kwuru sị, "Nna anyị ukwu, anyị na-echeta na mgbe onye ụgha ahụ dị ndụ, sịrị na ya ga-esi nʼọnwụ bilie mgbe ụbọchị atọ gasịrị. 64 Ya mere, nye iwu ka ndị agha gị na-eche ili ya nche, ruo mgbe ụbọchị atọ gasịrị. Nke a ga-egbochi ndị na-eso ụzọ ya ịga zuru ozu ya. Ka ha ghara sịkwa ndị mmadụ na o sitela nʼọnwụ bilie. bụrụ na ha agha ụgha dị otu a, ga-ajọrọ anyị njọ mgbe ahụ karịa na mbụ."

Veja também