Pular para o conteúdo
Publicidade

Mateus 4

Ọnwụnwa a nwara Jisọs nʼọzara

1 Emesịa, Mmụọ Nsọ duuru Jisọs baa nʼọzara ka ekwensu nwaa ya ọnwụnwa. 2 Mgbe o busiri ọnụ iri ụbọchị anọ ehihie na abalị, agụụ gụrụ ya nke ukwuu. 3 Mgbe ahụ onye ọnwụnwa ahụ bịakwutere ya sị, "bụrụ na bụ Ọkpara Chineke, gwa nkume ndị a ka ha ghọọ achịcha."

4 Ma Jisọs zara, "E dere ya nʼakwụkwọ nsọ sị, bụghị naanị site na achịcha4:4 Achịcha nwere ike bụrụ nri ka mmadụ si adị ndụ, kama site nʼokwu niile si nʼọnụ Chineke pụta.4:4 Okwu a dịkwa nʼakwụkwọ Dit 8:3."

5 Mgbe ahụ, ekwensu duuru ya baa nʼobodo nsọ ahụ, mee ka o guzo nʼebe dịkarịsịrị elu nke ụlọnsọ ukwu, 6 sị ya, "bụrụ na bụ Ọkpara Chineke, site nʼebe a tụda onwe gị nʼala. Nʼihi na e dere ya nʼakwụkwọ nsọ sị,

" ga-enye ndị mmụọ ozi ya iwu banyere gị,

ha ga-ebuli gị elu nʼaka ha

ka ghara ịkpọbi ụkwụ gị na nkume.4:6 Abụ 91:11,12"

7 Ma Jisọs zara sị ya, "E deela ya nʼakwụkwọ nsọ sị, gaghị anwa Onyenwe gị na Chineke gị ọnwụnwa.4:7 Gụọkwa ya nʼakwụkwọ Dit 6:16."

8 Ọzọkwa, ekwensu kpọọrọ ya gaa nʼelu ugwu dị elu, gosi ya alaeze niile nke ụwa na ebube ha. 9 sịrị ya, "Aga m enye gị ha niile ma bụrụ na daa nʼala kpọọ isiala nye m."

10 Ma Jisọs sịrị ya, "Si nʼebe m nọ pụọ, ekwensu. Nʼihi na akwụkwọ nsọ kwuru sị, bụ naanị Onyenwe anyị Chineke gị ka ga-akpọ isiala nye, naanị ya ka ga-efekwa.4:10 Nke a dịkwa nʼakwụkwọ Dit 6:13."

11 Mgbe ahụ ekwensu hapụrụ ya laa. Ndị mmụọ ozi bịakwutere ya, nọnyere ya, na-ejere ya ozi.

Veja também