Ọnwụnwa a nwara Jisọs nʼọzara
1 Emesịa, Mmụọ Nsọ duuru Jisọs baa nʼọzara ka ekwensu nwaa ya ọnwụnwa. 2 Mgbe o busiri ọnụ iri ụbọchị anọ ehihie na abalị, agụụ gụrụ ya nke ukwuu. 3 Mgbe ahụ onye ọnwụnwa ahụ bịakwutere ya sị, "Ọ bụrụ na ị bụ Ọkpara Chineke, gwa nkume ndị a ka ha ghọọ achịcha."
4 Ma Jisọs zara, "E dere ya nʼakwụkwọ nsọ sị, ‘Ọ bụghị naanị site na achịcha4:4 Achịcha nwere ike bụrụ nri ka mmadụ si adị ndụ, kama site nʼokwu niile si nʼọnụ Chineke pụta.’4:4 Okwu a dịkwa nʼakwụkwọ Dit 8:3."
5 Mgbe ahụ, ekwensu duuru ya baa nʼobodo nsọ ahụ, mee ka o guzo nʼebe dịkarịsịrị elu nke ụlọnsọ ukwu, 6 sị ya, "Ọ bụrụ na ị bụ Ọkpara Chineke, site nʼebe a tụda onwe gị nʼala. Nʼihi na e dere ya nʼakwụkwọ nsọ sị,
" ‘Ọ ga-enye ndị mmụọ ozi ya iwu banyere gị,
ha ga-ebuli gị elu nʼaka ha
ka ị ghara ịkpọbi ụkwụ gị na nkume.’4:6 Abụ 91:11,12"
7 Ma Jisọs zara sị ya, "E deela ya nʼakwụkwọ nsọ sị, ‘Ị gaghị anwa Onyenwe gị na Chineke gị ọnwụnwa.’4:7 Gụọkwa ya nʼakwụkwọ Dit 6:16."
8 Ọzọkwa, ekwensu kpọọrọ ya gaa nʼelu ugwu dị elu, gosi ya alaeze niile nke ụwa na ebube ha. 9 Ọ sịrị ya, "Aga m enye gị ha niile ma ọ bụrụ na ị daa nʼala kpọọ isiala nye m."
10 Ma Jisọs sịrị ya, "Si nʼebe m nọ pụọ, ekwensu. Nʼihi na akwụkwọ nsọ kwuru sị, ‘Ọ bụ naanị Onyenwe anyị Chineke gị ka ị ga-akpọ isiala nye, naanị ya ka ị ga-efekwa.’4:10 Nke a dịkwa nʼakwụkwọ Dit 6:13."
11 Mgbe ahụ ekwensu hapụrụ ya laa. Ndị mmụọ ozi bịakwutere ya, nọnyere ya, na-ejere ya ozi.