Pular para o conteúdo
Publicidade

Mateus 6

Ibu ọnụ

16 "Ọzọ, mgbe ọbụla unu na-ebu ọnụ, unu agbarụla ihu unu dịka ndị ihu abụọ na-eme. Nʼihi na ha na-agbarụ ihu ha ka ndị ọzọ hụ na ha na-ebu ọnụ. Nʼezie agwa m unu, ha anatala ụgwọ ọrụ ha. 17 Mgbe na-ebu ọnụ, tee isi gị mmanụ, ma saakwa ihu gị mmiri, 18 ka ndị ọzọ ghara ịhụta na na-ebu ọnụ kama ka bụrụ naanị nye Nna gị, onye anya na-adịghị ahụ. Nna gị, onye na-ahụ ihe niile na-eme na nzuzo, ga-akwụ gị ụgwọ.

Veja também