Pular para o conteúdo
Publicidade

Números 5

Idebe ọmụma ụlọ ikwu ọcha

1 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, 2 "Nye ndị Izrel iwu ka ha site nʼọmụma ụlọ ikwu ha kpọpụ onye ekpenta ọbụla maọbụ onye ihe si nʼahụ na-asọpụta, na ndị merụrụ onwe ha site nʼimetụ onye nwụrụ anwụ aka. 3 Iwu a metụtara onye ọbụla, nwoke na nwanyị. Kpọpụ ha ka ha gaa nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu, ka ha ghara imerụ ogige ụlọ ikwu ha bụ ebe ahụ m binyere unu." 4 Ndị Izrel mezuru iwu a, site nʼetiti ha kpọpụ ndị dị otu a, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.

Ịkwụghachi ụgwọ

5 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, 6 "Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, Mgbe onye ọbụla, nwoke maọbụ nwanyị, mejọrọ mmadụ ibe ya nʼụzọ ọbụla, si otu a bụrụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị bụ onye ikpe mara. 7 Onye dị otu a aghaghị ikwupụta mmehie ya, kwụghachi onye ahụ o mejọrọ ihe iwu kwuru na ga-akwụ. ga-atụkwasị nʼelu ihe na-akwụghachi onye ahụ o mejọrọ ego ọzọ ruru otu ụzọ nʼụzọ ise. 8 Ma bụrụ na onye ahụ enweghị onye ikwu ya bụ onye a ga-akwụghachi ụgwọ nʼihi mejọọ ahụ, ihe ịkwụghachi ụgwọ ahụ ga-abụ nke Onyenwe anyị, aghaghị inye onye nchụaja. A ga-atụkwasịkwa ya ebule a ga-eji chụọ aja mkpuchi mmehie nʼihi onye ahụ mehiere. 9 Onyinye niile dị nsọ ndị Izrel wetaara onye nchụaja bụ nke onye nchụaja ahụ. 10 Onyinye dị nsọ niile mmadụ na-eweta bụ nke onye na-eweta ya, ma onyinye e nyere onye nchụaja bụ nke onye nchụaja.’ "

Iwu banyere ekwesighị ntụkwasị obi

11 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, 12 "Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, bụrụ na nwunye mmadụ ejehie ụzọ bụrụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼebe di ya nọ 13 site nʼidinakwuru nwoke ọzọ nʼụzọ zoro ezo nʼebe di ya nọ ruo na achọpụtaghị adịghị ọcha ya (ebe a na-enweghị onye ga-agba akaebe megide ya, maọbụ na e jidere ya mgbe na-akwa iko ahụ), 14 bụrụ na mmụọ ekworo abịakwasị di ya, bụrụkwa na di nwanyị ahụ na-enyo nwunye ya enyo, na-ele ya anya dịka onye merụrụ onwe ya, ma bụkwanụ, bụrụ na di ya esite nʼekworo nyoo nwunye ya, bụ ezie na nwanyị ahụ bụ onye na-emerụghị onwe ya, 15 nwoke a ga-akpọrọ nwunye ya bịakwute onye nchụaja. ga-eweta onyinye iji ịbịaru nso nʼihi nwunye ya, nke bụ iko ụtụ ọka balị abụọ a na-awụkwasịghị mmanụ, maọbụ ụda na-esi isi ụtọ a gwakọrọ agwakọ, nʼihi na bụ onyinye mkpụrụ ọka e sitere nʼobi jupụtara nʼekworo nye, onyinye ịkpọtụ uche nʼikpe ọmụma.

16 " Onye nchụaja ga-akpọbata nwanyị a mee ka o guzo nʼihu Onyenwe anyị. 17 5:17 Mmiri nsọ ahụ, na aja si nʼala ụlọ nzute ahụ, bụ ihe na-egosi ikpe ọmụma sitere nʼaka Chineke megide onye ahụ ikpe mara.ga-ekunye mmiri nsọ nʼime ite aja, kporo aja nʼala site nʼụlọ nzute ahụ wụnye ya nʼime mmiri ahụ. 18 Dịka nwanyị ahụ guzo nʼihu Onyenwe anyị, onye nchụaja ahụ ga-atọsa agịrị isi ya, tinye onyinye mkpụrụ ọka ncheta ahụ, nke bụ onyinye mkpụrụ ọka ekworo ahụ nʼọbụaka nwanyị a. Onye nchụaja nʼonwe ya ga-eguzo nʼihu nwanyị a jide ite mmiri ilu ahụ na-eweta ọbụbụ ọnụ. 19 Mgbe ahụ, onye nchụaja ga-eme ka nwanyị a ṅụọ iyi, mgbe na-agwa ya okwu sị, "bụrụ na o nweghị nwoke ọbụla gị na ya nwere mmekọ, bụrụ na kpafughị ghọọ onye na-adịghị ọcha mgbe nọ nʼụlọ di gị, ka ihe ọjọọ ọbụla ghara izute gị site na mmiri ilu a na-eweta ọbụbụ ọnụ. 20 Ma bụrụ na kpafuola mgbe ka nọ nʼụlọ di gị, bụrụ na i merụọla onwe gị site na idinakwuru nwoke ọzọ na-abụghị di gị," 21 (nʼoge a, onye nchụaja ga-eme ka nwanyị a ṅụọ iyi nke ya na ọbụbụ ọnụ a so, gwa nwanyị okwu sị ya) "ka Onyenwe anyị mee ka ndị nọ nʼetiti ha bụọ gị ọnụ ma kọchaa gị mgbe o mere ka apata gị ree ure, mgbe o mere ka afọ gị koo eko. 22 Ka mmiri ilu a, nke na-eweta ọbụbụ ọnụ banye gị nʼahụ ime ka afọ gị koo eko, imekwa ka akpanwa gị daa ada."

" Nwanyị ahụ ga-aza sị, "Amen, ya dịrị m otu a."

23 " Mgbe ahụ onye nchụaja ahụ ga-ede ọbụbụ ọnụ ndị a nʼakwụkwọ, sanye ha nʼime mmiri ilu ahụ. 24 Mgbe ahụ, ga-enye nwanyị a mmiri ilu ahụ na-eweta ọbụbụ ọnụ ka ṅụọ, mmiri a ga-abanye ya nʼime ahụ, wetara ya ịta ahụhụ dị ilu. 25 Emesịa, onye nchụaja ga-anara nwanyị ahụ onyinye mkpụrụ ọka ekworo ahụ o ji nʼọbụaka ya, fegharịa ya nʼihu Onyenwe anyị, buru ya gaa nʼebe ịchụ aja. 26 Onye nchụaja ga-esite nʼonyinye mkpụrụ ahụ kporo nke ga-eju ya aka, nke na-anọchite anya ha niile, suo ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja. Emesịa, ga-enye nwanyị ahụ mmiri ahụ ka ṅụọ. 27 bụrụ na nwanyị a emerụọla onwe ya, bụrụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye di ya, mgbe ṅụrụ mmiri na-eweta ọbụbụ ọnụ, ga-abanye nʼime ya wetara ya ahụhụ dị ilu. Afọ ya ga-eko, buo ibu,5:27 Afọ ya ga-aza aza akpanwa ya a gaghị anagide nwa. ga-aghọ onye a bụrụ ọnụ nʼetiti ndị ya. 28 Ma bụrụ na nwanyị emerụghị onwe ya, kama bụ onye dị ọcha, ga-abụ onye nwere onwe ya site nʼikpe ọmụma. ga-atụrụ ime mụta ụmụ.

29 " Nke a bụ iwu metụtara ikwo ekworo mgbe nwanyị bi nʼụlọ di ya kpafuru merụọ onwe ya. 30 Maọbụ mgbe ekworo jupụtara nwoke nʼobi nʼihi na gụrụ nwunye ya dịka onye na-ekwesighị ntụkwasị obi. Onye nchụaja ga-eme ka nwanyị a guzo nʼihu Onyenwe anyị, mezuokwa ihe niile nʼusoro dịka e si depụta ha nʼebe a. 31 A gaghị ama di nwanyị a ikpe dịka onye mere ihe ọjọọ, kama nwanyị a ga-ebu ahụhụ ya na mmehie ya naanị ya.’ "

Veja também