Pular para o conteúdo
Publicidade

Rut 1

11 Naomi zara sị ha, "Laghachinụ ụmụ m, bụ nʼihi gịnị ka unu ga-eji soro m laa? E nwere m ike ịmụta ụmụ ndị ikom ọzọ ndị ga-abụ di unu?1:11 Ajụjụ a bụ nʼihi omenaala ndị Juu, nke bụ, na nwanyị ọbụla na-amụtaghị nwa tupu di ya a nwụọ, na nwanne di ya ga-alụrụ ya. Jen 38:6-8; Dit 25:5-10 12 Laghachinụ azụ ụmụ m. Emeela m agadi ịlụ di ọzọ. A sịkwarị na olileanya fọdụụrụ m ịlụ di na ịmụta ụmụ ndị ikom nʼabalị taa, 13 unu ga-echere ruo mgbe ha tolitere? Unu ga-anọ na-alụghị di ọzọ? Mba, ụmụ m ndị inyom, ọnọdụ m dị ilu karịa nke unu, nʼihi1:13 Nkp 2:15; Job 19:12; Abụ 38:2 na Onyenwe anyị esepụtala aka ya imegide m."

Veja também

Rute
Ver todos os capítulos de Rute