Adoração
A adoração é a resposta do coração humano à majestade de Deus. Deus é Espírito e importa que os que o adoram o adorem em espírito e em verdade — com todo o ser.
Adorar em espírito
Deus é Espírito e importa que os adoradores o adorem em espírito e em verdade. A adoração verdadeira brota do coração.
Chineke bụ mmụọ ndị niile na-efe ya ga-eferịrị ya nʼime mmụọ na eziokwu."
Ma oge na-abịa, ugbu a ọ bịala, mgbe ndị na-efe Nna ahụ nʼeziokwu ga-efe ya nʼime mmụọ na nʼeziokwu. Nʼihi na ọ bụ ndị dị otu a ka Nna chọrọ ka ha na-efe ya. Chineke bụ mmụọ ndị niile na-efe ya ga-eferịrị ya nʼime mmụọ na eziokwu."
Jisọs sịrị ya, "Nwanyị kwere okwu m, oge na-abịa mgbe ị na-agaghị akpọ isiala nye Nna, maọbụ nʼugwu a ma ọ bụkwanụ na Jerusalem. Unu na-efe ihe unu na-amaghị ma anyị na-efe ihe anyị matara, nʼihi na nzọpụta sitere nʼaka ndị Juu. Ma oge na-abịa, ugbu a ọ bịala, mgbe ndị na-efe Nna ahụ nʼeziokwu ga-efe ya nʼime mmụọ na nʼeziokwu. Nʼihi na ọ bụ ndị dị otu a ka Nna chọrọ ka ha na-efe ya.
Ọ sịrị, "Onyenwe m, ekwela m." Ọ kpọrọ isiala nye ya.
Ma Jisọs sịrị ya, "Si nʼebe m nọ pụọ, ekwensu. Nʼihi na akwụkwọ nsọ kwuru sị, ‘Ọ bụ naanị Onyenwe anyị Chineke gị ka ị ga-akpọ isiala nye, naanị ya ka ị ga-efekwa.’."
Jisọs zara ya sị, "E deela ya: ‘Ị ga-akpọ isiala nye Onyenwe anyị Chineke gị, naanị ya ka ị ga-efekwa.’ "
Aja dị ndụ
Ya mere, ụmụnna m, eji m obi ebere Chineke na-arịọ ka unu chee anụ ahụ unu dịka aja dị ndụ, dịkwa nsọ, ma bụrụkwa nke na-atọ Chineke ụtọ, nke bụkwa ofufe nke ime mmụọ unu.
Aja dị ndụ
Ya mere, ụmụnna m, eji m obi ebere Chineke na-arịọ ka unu chee anụ ahụ unu dịka aja dị ndụ, dịkwa nsọ, ma bụrụkwa nke na-atọ Chineke ụtọ, nke bụkwa ofufe nke ime mmụọ unu. Unu eyila ụwa nke a, kama bụrụnụ ndị enwoghara site nʼịgbanwe uche unu. Mgbe ahụ, unu ga-enwe ike nwapụta ihe bụ uche Chineke na ihe ọ na-achọ, nke bụ ezi ihe, nke na-atọ ya ụtọ na nke zukwara oke.
Nʼihi na ihe niile sitere nʼime ya, sitekwa nʼaka ya, dịkwara ya.
Ọ bụ ya ka otuto dịrị ruo mgbe niile ebighị ebi! Amen.
E dere ya,
" ‘Nʼezie, dịka m na-adị ndụ,’ ka Onyenwe anyị kwuru,
‘ikpere niile ga-egbu nʼihu m;
ire niile ga-ekwupụtakwa Chineke.’ "
Louvor e reverência
Vinde, adoremos e prostremo-nos. Louvai ao Senhor! Todo ser que respira louve o nome glorioso do Senhor.
Bịanụ ka anyị kpọọ isiala nʼofufe,
ka anyị gbuo ikpere nʼala nʼihu Onyenwe anyị, onye kere anyị;
Bịanụ ka anyị kpọọ isiala nʼofufe,
ka anyị gbuo ikpere nʼala nʼihu Onyenwe anyị, onye kere anyị;
Ka ihe niile too Onyenwe anyị
Toonu Onyenwe anyị.
Toonu Chineke nʼime ụlọnsọ ya.
Toonu ya, na mbara igwe nke ike ya.
Toonu ya, nʼihi ọrụ niile ọ rụrụ site nʼike ya.
Toonu ya, nʼihi ịdị ukwuu ya nke kachasị ịdị ukwuu niile.
Werenụ opi ike too ya,
werekwanụ ụbọ akwara na une too ya,
jirinụ ihe iti egwu na ite egwu too ya,
jirikwanụ ụbọ akwara dị iche iche na ọja too ya,
werenụ ogene too ya,
werekwanụ ogene na-ada oke ụda too ya.
Ka ihe niile na-eku ume too Onyenwe anyị.
Toonu Onyenwe anyị.
Ka ihe niile na-eku ume too Onyenwe anyị.
Toonu Onyenwe anyị.
Jirinụ ekele banye nʼọnụ ụzọ ama ya
jiri otuto baa nʼogige ya;
keleenụ ya, tookwa aha ya.
Nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ kwesiri aha ya;
kpọọ isiala nye Onyenwe anyị nʼebube nke ịdị nsọ ya.
Abụ ekele
Ụwa niile, jirinụ ọṅụ tikuo Chineke!
Bụọ abụ banyere ebube aha ya;
meenụ ka otuto ya bụrụ ihe dị ebube!
Gwa Chineke okwu sị ya, "Lee ka ọrụ gị niile si dị oke egwu!
Ike gị dị nnọọ ukwu,
ya mere ndị iro gị, na-ada nʼihu gị nʼihi ụjọ.
Ndị niile bi nʼụwa na-akpọ isiala nye gị;
ha na-abụku gị abụ otuto,
ha na-abụ abụ otuto nye aha gị." Sela
Eji m ọnụ m kpọkuo ya;
otuto ya dị m nʼire.
Mba niile i kere ga-abịa nʼihu gị,
fee gị ofufe, O Onyenwe anyị;
ha ga-ebutere aha gị ebube.
Nʼihi na ị dị ukwuu na-arụkwa ọrụ ebube dị iche iche;
ọ bụ naanị gị bụ Chineke.
Gọzie Onyenwe anyị
Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị;
ka ihe niile dị nʼime m too aha nsọ ya.
Toonu Chineke onye na-edebe ọgbụgba ndụ
Nyenụ Onyenwe anyị otuto, kwupụtakwa aha ya.
Meenụ ka amata nʼetiti mba niile banyere ihe niile ọ rụrụ.
Onye ihe Chineke na-agụsị agụụ ike
O Chineke, ị bụ Chineke m,
e ji m obi m niile na-achọ gị;
akpịrị na-akpọ mkpụrụobi m nkụ,
anụ ahụ m na-achọsi gị ike,
nʼala kpọrọ nkụ na nke ịda mba
ebe mmiri na-adịghị nʼime ya.
Nʼihi na ịhụnanya gị dị mma karịa ndụ,
aga m eji egbugbere ọnụ m jaa gị mma.
Ogologo ụbọchị m niile ka m ga-eto gị,
aga m eweli aka m abụọ elu kpọkuo aha gị.
Declarações de adoração
Tu és digno, Senhor, de receber glória e honra! Ao Senhor pertence a grandeza, o poder, a glória e a majestade.
"Gị, Onyenwe anyị na Chineke anyị,
kwesiri ịnara otuto, na nsọpụrụ, na ike.
Nʼihi na gị onwe gị kere ihe niile,
ọ bụkwa site nʼọchịchọ gị ka e ji kee ha,
ma meekwa ka ha dịrị ndụ."
O jiri oke olu kwuo sị, "Tụọnụ egwu Chineke, nyekwanụ ya otuto, nʼihi na oge ikpe ya eruola. Kpọọkwanụ isiala nye ya, bụ onye kere eluigwe na ala, na oke osimiri na isi iyi mmiri niile."
Onye ga-aghara ịtụ gị egwu, Onyenwe anyị,
onye ga-agharakwa ito aha gị?
Nʼihi na ọ bụ naanị gị dị nsọ.
Mba niile ga-abịakwa
ịkpọ isiala nʼihu gị,
nʼihi na emeela ka ọrụ ezi omume gị pụta ìhè."
Mụ onwe m bụ Jọn, hụrụ ihe ndị a niile, nụkwa ha. Mgbe m hụrụ ma nụchaa ihe ndị a niile, adara m nʼụkwụ mmụọ ozi a gosiri m ha ịkpọ isiala nye ya. Ma ọ sịrị m, "Emela ihe dị otu ahụ! Mụ onwe m bụkwa odibo Jisọs dịka gị onwe gị, na dịka ụmụnna gị ndị amụma, na dịka ndị ahụ niile na-edebe okwu niile e dere nʼakwụkwọ a. Kpọọrọ Chineke isiala."
Gị onwe gị, Onyenwe anyị nwe ịdị ukwu, na ike,
na ịma mma, na ugwu eze, na ebube,
nʼihi na ihe niile nʼeluigwe na nʼụwa bụ nke gị.
Gị onwe gị, Onyenwe anyị nwe alaeze.
Gị kwa ka e buliri elu dịka onye na-achị isi nʼelu ihe niile.
Keleenụ Onyenwe anyị, nʼihi na ọ dị mma,
nʼihi na ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
Tikuonụ ya mkpu sị, "Zọpụta anyị, gị Chineke, Onye nzọpụta anyị;
chịkọta anyị, ma napụtakwa anyị site nʼaka mba dị iche iche,
ka anyị nwee ike nye aha nsọ gị ekele;
ma nyaakwa isi nʼime otuto gị."
Otuto dịrị Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel,
site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi.
Mgbe ahụ, mmadụ niile sịrị, "Amen" na "Toonu Onyenwe anyị."
Keleenụ Onyenwe anyị, nʼihi na ọ dị mma,
nʼihi na ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
Bụkuonụ ya abụ, bụkuonụ ya abụ otuto;
kwupụtaranụ mba niile ọrụ ebube ya niile.
Ọ bụ nʼihi nke a ka Chineke ji bulie ya elu nʼebe kachasị elu,
nyekwa ya aha kachasị aha niile elu.
Ka ọ ga-abụ mgbe ọbụla a kpọrọ aha Jisọs ka ikpere niile ọbụla gbuo nʼala,
ihe niile dị nʼeluigwe, ndị niile bi nʼụwa, na ndị bi nʼokpuru ụwa.
Ka ire niile ọbụla kwupụta na Jisọs Kraịst bụ Onyenwe anyị,
maka inye Chineke bụ Nna, otuto.
Sacrifício de louvor
Por meio de Jesus ofereçamos sempre sacrifício de louvor. Cantai ao Senhor, celebrai em salmos — enchei-vos do Espírito.
Site na ya, ka anyị na-achụrụ Chineke aja otuto mgbe niile, nke bụ mkpụrụ egbugbere ọnụ nke na-ekwupụta aha ya.
Ya mere, ebe anyị na-anata alaeze nke na-apụghị ịgbanwe, ka anyị jiri obi ekele, egwu na nsọpụrụ fee Chineke ofufe nʼụzọ ọ ga-anabata. Nʼihi na Chineke anyị bụ ọkụ na-erepịa erepịa.
werenụ abụ ọma, na abụ nke ime mmụọ na-ekwe ukwe nʼetiti onwe unu. Werekwanụ obi unu niile na-abụrụ Onyenwe anyị abụ dị ụtọ.
Ka okwu nke Kraịst biri nʼime unu nʼuju ya. Werenụ amamihe niile na-akụzirịta ibe unu ihe, ma na-adụrịtakwa ibe unu ọdụ. Werekwanụ abụ ọma na abụ nke ime mmụọ bụọrọ Chineke abụ ekele nʼobi unu.
Nʼetiti abalị, mgbe Pọl na Saịlas na-ekpe ekpere na-abụkwa abụ ito Chineke, ndị niile nọ nʼụlọ mkpọrọ ahụ na-ege ha ntị.
Ekele dịrị Chineke onye nkasiobi
Otuto dịrị Chineke na Nna nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, bụ Nna nke obi ebere, nakwa Chineke nke nkasiobi niile. Onye na-akasị anyị obi nʼime nsogbu anyị niile, ka anyị site nʼụzọ dị otu a nwee ike ịkasị ndị ọzọ niile nọ na nsogbu dị iche iche obi. Inyere ha aka dịka anyị onwe anyị si nata inyeaka site nʼaka Chineke.
Anyị na-ekwusara unu ihe anyị hụrụ na nke anyị nụrụ, ka unu soro anyị nwee nnwekọ. Nʼezie nnwekọ anyị bụ nke anyị na Nna na nke Ọkpara ya bụ Jisọs Kraịst, na-enwekọ.
Adoração como vida
Exaltai ao Senhor, prostrai-vos ante o escabelo dos seus pés. A adoração genuína transforma o adorador e agrada o Criador.
Bulienụ Onyenwe anyị Chineke anyị elu,
feenụ ofufe nʼihu ebe ihe ịtụkwasị ụkwụ ya;
ọ dị nsọ.
Ọnụ m jupụtara nʼotuto gị,
ọ na-ekwupụta ịma mma gị ogologo ụbọchị niile.
Bụkuo Chineke abụ, bụkuonụ aha ya abụ otuto,
toonu onye na-agba igwe ojii dịka ịnyịnya,
Onyenwe anyị bụ aha ya, ṅụrịa ọṅụ nʼihu ya.
Ọ bụ nna ndị nke na-enweghị nna, onye na-ekpechitere ndị di ha nwụrụ anwụ ọnụ ha,
onye a bụ Chineke, onye bi nʼebe ya dị nsọ.
Aga m enye Onyenwe anyị ekele nʼihi ezi omume ya,
aga m abụku aha Onyenwe anyị, Onye kachasị ihe niile elu abụ otuto.
Aga m ekwupụta aha gị nye ụmụnna m;
nʼetiti ọha mmadụ aga m enye gị otuto.
Toonu Onyenwe anyị! Unu niile bụ ndị na-atụ egwu ya;
unu bụ ndị agbụrụ Jekọb, sọpụrụnụ ya!
Tụọnụ ya egwu, unu agbụrụ Izrel!
Ana m agbasa aka m abụọ nye gị;
agụụ gị na-agụ mkpụrụobi m dịka agụụ mmiri ozuzo si agụ ala kpọrọ nkụ. Sela
O mkpụrụobi m, gịnị mere i ji daa mba?
Gịnị mere i ji na-asụ ude nʼime m?
Nwee olileanya na Chineke,
nʼihi na m ka ga-eto ya ọzọ,
Onye nzọpụta m na Chineke m.
A gwara m Onyenwe anyị, "Ị bụ Onyenwe m,
e wezuga gị, enwekwaghị m ọdịmma ọbụla."
Jirinụ ịtụ egwu fee Onyenwe anyị ofufe;
jirikwanụ ịma jijiji ṅụrịa ọṅụ nʼihu ya.
Obi ga-atọ m ụtọ; obi m ga-ejupụta nʼọṅụ nʼihi gị,
aga m abụrụ gị abụ otuto, gị Onye kachasị ihe niile elu.
Falsa adoração
Não terás outros deuses diante de mim. Não adorarás ídolos. A adoração exclusiva ao Senhor é mandamento inegociável.
Gị akpọla isiala nye ha, efekwala ha ofufe, nʼihi na Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke gị, abụ m Chineke ekworo. Onye na-ata ụmụ na ụmụ ụmụ ahụhụ, nʼihi ajọ omume nke ndị mụrụ ha, ọ bụladị ruo nʼọgbọ nke atọ na nke anọ, nke ndị ahụ kpọrọ m asị.
Unu efela chi ọzọ, nʼihi na Onyenwe anyị, onye aha ya bụ Ekworo, bụ Chineke na-ekwo ekworo.
Mgbe ọ banyere nʼụlọ ikwu ahụ; ogidi igwe ojii ahụ na-abịa guzochie nʼọnụ ụzọ mgbe Onyenwe anyị na Mosis na-akparị ụka. Nʼoge ọbụla, ndị mmadụ hụrụ ogidi igwe ojii ahụ ka o guzo nʼọnụ ụzọ ụlọ ikwu nzute ahụ, ha onwe ha na-eguzokwa, onye ọbụla, nʼọnụ ụzọ ụlọ ikwu ha, kpọọ isiala.
"Onyenwe anyị bụ ike m na abụ m.
Ọ ghọrọla m nzọpụta.
Ọ bụ Chineke m, aga m etokwa ya,
Chineke nke nna m, aga m ebulikwa ya elu.
Onye dịka gị Onyenwe anyị,
nʼetiti chi niile?
Onye dịka gị?
Onye dị ebube nʼịdị nsọ.
Onye otuto ya na-eyi egwu.
Onye na-arụ ọrụ dị ebube?
Ma unu ga-efe Onyenwe anyị bụ Chineke unu. Mgbe ahụ, ngọzị ya ga-adịkwasị nri unu na mmiri ọṅụṅụ unu. Aga m ewezugakwa ọrịa nʼetiti unu.
Ọ bụ ya bụ onye ị ga-eto otuto, ọ bụ ya bụ Chineke gị, onye rụrụ gị ọrụ ndị ahụ dị oke egwu na ebube, nke gị onwe gị ji anya gị hụ.
Unu na ezinaụlọ unu ga-anọkwa nʼebe ahụ, nʼihu Onyenwe anyị Chineke unu, rie oriri unu. Nʼihu ya kwa ka unu ga-aṅụrịkwa ọṅụ, nʼihi ihe niile ahụ unu setịpụrụ aka unu ime, na nʼihi ngọzị Onyenwe anyị Chineke unu gọziri unu.
Ha sitere na chi ndị ala ọzọ ha kpasuo ekworo ya,
meekwa ka iwe wee ya nʼihi ihe arụ nke arụsị ha.
Ha chụrụ aja nye ụmụ mmụọ, ndị na-abụghị Chineke,
bụ chi ndị ha na-amaghị,
chi ndị ka pụtara ọhụrụ,
chi ndị ahụ nna nna ha na-atụghị ụjọ ha.
Ị gbakụtara Oke Nkume ahụ mụrụ gị azụ,
i chefuru Chineke ahụ mụrụ gị.
Ma lezienụ anya, ka ahapụ ịrafu obi unu mee ka unu wezuga onwe unu, bido ife chi ndị ọzọ ofufe, kpọọkwa isiala nye ha.
Onyenwe anyị sịrị,
"Ndị a ji ọnụ ha na-abịa m nso,
ha ji egbugbere ọnụ ha na-asọpụrụ m,
ma obi ha dị anya nʼebe m nọ.
Ofufe ha na-efe m, bụ nke
gbadoro ụkwụ nʼihe mmadụ nyere nʼiwu, bụkwa nke a kuziiri ha.
Toonu Onyenwe anyị
O Onyenwe anyị, ị bụ Chineke m;
aga m ebuli gị elu, nye aha gị otuto,
nʼihi na site na ntụkwasị obi zuruoke,
ị rụọla ọtụtụ ihe ịrịbama,
nke i tụrụ atụmatụ ha siterị nʼoge gara aga.
Ma Chineke chepuru ihu ya site nʼebe ha nọ. Ọ rara ha nye ikpere usuu ihe dị nʼeluigwe. Nke a dabara nʼihe e dere nʼakwụkwọ ndị amụma,
" ‘Unu ụlọ Izrel, unu o wetara m onyinye anụ e gburu egbu ka ọ dị aja unu chụụrụ m
iri afọ anọ unu nọrọ nʼọzara?
Unu buliri ụlọ ikwu nke Mọlọk
na kpakpando nke chi unu bụ Refan,
bụ arụsị ndị ahụ unu mere ịkpọ isiala nye ha.
Ya mere, aga m ewezuga unu, burukwa unu gaa nʼofe obodo Babilọn.’
Unu ekwela ka onye ọbụla nke ọ na-amasị ife ndị mmụọ ozi maọbụ ibi ndụ umeala nke aghụghọ dị nʼime ya, onye na-ekwu ọtụtụ okwu banyere ọhụ ọ hụrụ, si otu a na-afụli onwe ya elu nʼefu nʼihi echiche nke onwe ya, maa unu ikpe ma napụ unu ihe nrite unu. Onye na-adịghị ejidesikwa onye bụ isi aka ike, onye a na-esite nʼaka ya na-eme ka ahụ niile, nke nkwonkwo ha na akwara ha niile na-ejikọta nʼotu, too eto dị ka Chineke si chọọ ka ha too.
Unu ekwela ka onye ọbụla duhie unu nʼụzọ ọbụla, nʼihi na ụbọchị ahụ agaghị abịa tutu ruo mgbe oke inupu isi ga-adị, na mgbe a ga-ekpughe onye mmebi iwu ahụ nke a kara akara ịla nʼiyi. Onye mmebi iwu ahụ ga-ebuli onwe ya elu megide ihe niile a na-akpọ chi maọbụ nke a na-efe ofufe, nke ga-eme ka o dozie onwe ya nʼụlọnsọ Chineke, na-ekwupụta na ya bụ Chineke.
Exemplos de adoração
Jó adorou em meio ao sofrimento. Esdras adorou na restauração. Paulo e Silas adoraram na prisão — e Deus respondeu.
Mgbe Job nụrụ ihe ndị a, o sitere nʼebe ọ nọ bilie ọtọ, dọwaa uwe ya, kpụchaa agịrị isi ya, ọ dara nʼala ma kpọọ isiala, kwuo sị:
"Ọtọ ka m gba mgbe m si nʼafọ nne m pụta
nʼọnọdụ ịgba ọtọ ka m ga-eji laghachikwa.
Onyenwe anyị nyere ihe niile, Onyenwe anyị ewerekwala ihe niile,
ka aha Onyenwe anyị bụrụ ihe a gọziri agọzi."
Ha ji abụ otuto na ekele bụkuo Onyenwe anyị abụ sị:
"Ọ dị mma,
ịhụnanya ya nʼebe Izrel nọ na-adị ruo ebighị ebi."
Mmadụ niile jiri oke olu too Onyenwe anyị nʼihi ntọala ụlọnsọ ukwu ahụ ha tọrọ.
Ugbu a, mụ bụ Nebukadneza na-eto, na-asọpụrụ Eze nke eluigwe, nʼihi na ọrụ ya niile dị mma, ụzọ ya niile kwụ ọtọ. Nʼihi na o nwere ike ijide ndị nganga kwanye ha ọnụ nʼime ntụ.
"Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, lee ka i si dị ukwuu! Ọ dịghị onye dịka gị. Ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị ma ọ bụghị gị, dịka anyị nụrụ ya na ntị anyị.
"O nweghị onye dị nsọ dịka Onyenwe anyị;
o nweghị onye dị karịa gị,
o nweghị nkume ọzọ yiri Chineke anyị.
Ndị Livayị ndị a, Jeshua, Kadmiel, Bani, Hashabneia, Sherebaya, Hodia, Shebanaya na Petahaya sịrị, "Bilienụ ọtọ, too Onyenwe anyị Chineke unu, onye na-adị site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi."
"Ka aha gị dị ebube bụrụ ihe a gọziri agọzi, ka ọ bụrụ ihe e buliri elu karịa ngọzị niile na otuto niile.
A sịkwarị na osisi fiig amaghị ifuru,
na ọ dịghị mkpụrụ dị nʼosisi vaịnị,
a sịkwa na mkpụrụ osisi oliv ebilata
na ala ubi niile emepụtaghị ihe oriri,
a sịkwa na ọ dịghị atụrụ dị nʼọgba anụ,
na ọ dịkwaghị ehi nọ nʼụlọ anụmanụ,
mụ onwe m ga-anọgide na-aṅụrị ọṅụ nʼime Onyenwe anyị.
Aga m etegharịkwa egwu ọṅụ nʼime Chineke Onye nzọpụta m.
Mgbe ahụ, unu ga-abịakwute m, unu ga-abịa kpọkuokwa m nʼekpere, aga m egekwa unu ntị.
Bịakwutenụ Chineke nso, ya onwe ya ga-abịakwutekwa unu nso. Kwọọnụ aka unu, unu ndị mmehie, meekwanụ ka obi unu dị ọcha, unu ndị obi abụọ.