Pular para o conteúdo
Publicidade

Salmos 29

Abụ Ọma Devid.

Olu Onyenwe anyị

1 Toonu Onyenwe anyị, unu ndị bi nʼeluigwe,

nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ nʼihi ebube na ike ya.

2 Nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ kwesiri aha ya;

kpọọ isiala nye Onyenwe anyị nʼebube nke ịdị nsọ ya.

3 Olu Onyenwe anyị na-ada nʼelu osimiri;

olu Chineke dị ebube na-ada ike ike,

olu Onyenwe anyị na-ada dịka egbe eluigwe29:3 Job 37:4-5; Abụ 18:13 nʼelu oke osimiri.

4 Olu Onyenwe anyị dị ike,

olu Onyenwe anyị jupụtakwara nʼebube.

5 Olu Onyenwe anyị na-etiwa osisi ukwu sida;

Onyenwe anyị na-etiwasị osisi ukwu sida nke Lebanọn.

6 na-eme ka Lebanọn wulie elu dịka nwa ehi,

na-eme ka Siriọn29:6 Nke a bụ aha ndị Fonikisi bi na mpaghara ugwu Hemon na-akpọ ugwu ahụ. Hemon dị nʼoke ala nkwa ahụ nʼebe ugwu. Dit 3:9; Abụ 42:6 wulie elu dịka nwa atụ.

7 Olu Onyenwe anyị na-agba dịka egbe eluigwe

mgbe amụma na-egbu.

8 Olu Onyenwe anyị na-eme ka ọzara maa jijiji;

Onyenwe anyị na-eme ka ọzara Kadesh maa jijiji.

9 Olu Onyenwe anyị na-eme ka osisi ook gbagọọ29:9 Ime na-eme nne ele

na-agbuchapụkwa akwụkwọ niile nke oke ọhịa.

Nʼime ụlọnsọ ukwuu ya mmadụ niile na-eti, "Ebube!"

10 Onyenwe anyị nọ nʼocheeze ya nʼelu uju mmiri;

Onyenwe anyị na-achị dịka eze ruo mgbe ebighị ebi.

11 Onyenwe anyị na-enye ndị ya ike,

ga-ejikwa udo gọzie ndị ya.

Veja também