Publicidade

Salmos 16

Abụ miktam nke Devid.

Ekpere maka iguzosi ike

1 Chebe m, O Chineke,

nʼihi na nʼime gị ka m gbabara izere ndụ.

2 A gwara m Onyenwe anyị, "bụ Onyenwe m,

e wezuga gị, enwekwaghị m ọdịmma ọbụla."

3 Ana m asị maka ndị nsọ bụ ndị nọ nʼala a,

"Ha bụ ndị a na-asọpụrụ, ndị ihe ha nʼatọ m ụtọ."

4 Iru ụjụ nke ndị ahụ na-agbaso chi ndị ọzọ ga-aba ụba.

Agaghị m eso ha wụsa aja ihe ọṅụṅụ ọbara16:4 Nʼọtụtụ mba, mmanya bụ ihe e ji agọ ọfọ, ma nʼomenaala mba ụfọdụ, ọbara onye ahụ eji achụ aja ka a na-ewere gwakọọ na mmanya, wụpụ nʼebe ịchụ aja, nke ka a maara dịka aja ọbara. Ọ bụ omenaala mba ndị ahụ na-amaghị Chineke ka onye dere abụ ọma a na-emegide. Lev 18:21; Lev 20:1-2; 2Ez 16:3; 2Ez 23:10. nye chi ndị a,

maọbụ were egbugbere ọnụ m kpọọ aha ha.

5 Onyenwe anyị, i nyeela m oke m na iko m;16:5 Iko a na-ekwu ihe banyere ya nʼebe a bụ iko a na-enye ndị akpọrọ oriri nʼoge mmemme. Dan 5:1-4

na-elekọta ihe niile bụ nke m site nʼife nza.

6 Ọtụtụ oke ala niile dabara m nʼebe dị ezi mma;

nʼezie, e nwere m ihe nketa nke na-enye m ọṅụ.

7 Aga m eto Onyenwe anyị, onye na-adụ m ọdụ;

bụladị nʼabalị, obi m na-agwa m ihe m ga-eme.

8 Ana m elekwasị Onyenwe anyị anya mgbe niile.

Ebe nọ nʼaka nri m, agaghị m ama jijiji.

9 Nʼihi nke a, obi dị m ụtọ, ire m jupụtakwara nʼọṅụ;

aga m anọkwa nʼudo.

10 Nʼihi na gaghị ahapụ m nʼala mmụọ,

gaghị ekwekwa ka Onye gị kwesiri ntụkwasị obi16:10 Maọbụ, onye gị dị nsọ hụ ire ure.

11 I gosila m ụzọ ndụ;

ga-eji ọṅụ mejupụta obi m nʼihu gị;

ya na ihe ụtọ ndị dị nʼaka nri gị ruo ebighị ebi.

Veja também

Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-07-05_19-25-13-