Publicidade

O adultério

Por Bíblia Online

O adultério é pecado grave que destrói alianças, famílias e vidas. A Bíblia condena firmemente a infidelidade conjugal e chama à pureza, fidelidade e santidade no casamento.

A lei de Deus

Não adulterarás. Quem comete adultério destrói a própria alma. A Palavra de Deus é clara e direta sobre este pecado.

Gị akwala iko.

" bụrụ na nwoke ọbụla edinakwuru nwunye nwoke ọzọ, ya bụ nwunye onye agbataobi ya, nwoke ahụ na nwanyị kwara iko ka a ga-egbu.

" A kpọrọkwala nwunye onye agbataobi gị idina ya, si otu a merụọ onwe gị nʼihi mmekọ dị otu a.

Ma nwoke ahụ na-akwa iko bụ onye nzuzu, amamihe kọrọ ya,

nʼihi na bụ onwe ya ka na-ala nʼiyi.

Ma nwoke ahụ na-akwa iko bụ onye nzuzu, amamihe kọrọ ya,

nʼihi na bụ onwe ya ka na-ala nʼiyi.

A ga-eti ya ezi ihe otiti, a ga-elelikwa ya anya,

ihere ya agaghị ekwe ihichapụ.

Nʼihi na di nwanyị ahụ ga-esite nʼekworo wee iwe dị ọkụ;

gakwaghị enwe obi ebere nʼebe nọ nʼụbọchị ga-abọ ọbọ.

gaghị anara ihe ọbụla nʼọnọdụ ihe nkwụghachi nʼihi ihe ọjọọ o mere ya.

O nwekwaghị ihe a ga-enye ya pụrụ ime ka iwe ya dajụọ.

Mmadụ pụrụ ịgụrụ ọkụ tụkwasị nʼahụ ya,

ma uwe ya ereghị ọkụ?

Mmadụ pụrụ ije ije nʼelu icheku ọkụ

ma ụkwụ ya ahapụ igbuchapụ?

Otu a ka na-adịrị nwoke na-abakwuru nwunye mmadụ ibe ya;

o nweghị onye ọbụla na-emetụ ya aka nke a na-agaghị ata ahụhụ.

Jesus ensina

Quem olhar para uma mulher com intenção impura já adulterou no coração. Jesus elevou o padrão da pureza.

Ịkwa iko

"Unu nụrụ na e kwuru sị, Akwala iko. Ma asị m unu, onye ọbụla lere nwanyị anya site na-agụụ ịkwa iko emeelarị mmehie ịkwa iko nʼime obi ya megide nwanyị ahụ.

Ma asị m unu, onye ọbụla gbara nwunye ya alụkwaghị m, ma bụghị nʼihi ịkwa iko, na-etinye nwanyị ahụ nʼọnọdụ ga-eme ka kwaa iko. bụrụ na nwanyị ahụ alụọ di ọzọ, nwoke ahụ lụrụ nwanyị ahụ na-emekwa mmehie ịkwa iko.

Nʼihi na bụ nʼime obi mmadụ ka echiche ime ihe ọjọọ ndị a si apụta: igbu mmadụ, ịkwa iko niile, ịkwa iko nke ndị ikom nwere nwunye na ndị inyom nwere di, na izu ohi, na ama ụgha, na nkwulu.

sịrị ha, "Onye ọbụla gbara nwunye ya alụkwaghị m ma lụrụ nwanyị ọzọ na-eme mmehie ịkwa iko megide ya. Ma bụrụ na nwanyị ọbụla agbaa dị ya alụkwaghị m ma lụrụ nwoke ọzọ, na-emekwa mmehie ịkwa iko."

"Onye ọbụla gbara nwunye ya alụkwaghị m ma lụrụ nwanyị ọzọ na-eme mmehie ịkwa iko. Onye bụlakwa lụrụ nwanyị di ya jụrụ na-eme mmehie ịkwa iko.

Ha sịrị ya, "Onye ozizi, anyị jidere nwanyị a ka na-akwa iko. Nʼiwu, Mosis nyere anyị ikike ka e jiri okwute tugbuo onye mere ihe dị otu a. Gịnị ka i nwere ikwu banyere nke a?" Ha kwuru nke a iji nwalee ya, iji nweta ihe ha ga-eji ebo ya ebubo.

Ma Jisọs hulatara ala were mkpịsịaka ya dee ihe nʼala. Mgbe ha nọgidere na-ajụ ya ajụjụ, o biliri sị ha, "Onye ọbụla nʼime unu na-emebeghị mmehie ọbụla, ya buru ụzọ tụọ ya nkume." Ọzọ, o hulatakwara ala malite ide ihe na-ede nʼala.

Mgbe ha nụrụ nke a, ha niile nʼotu nʼotu, malite nʼonye okenye ha, sitere nʼebe ahụ pụọ. Nʼikpeazụ, fọdụrụ naanị Jisọs na nwanyị ahụ, ebe o guzoro nʼihu ya. Jisọs guzoro ọtọ jụọ ya sị, "Nwanyị, oleekwanụ ha? dịghị onye mara gị ikpe?"

sịrị, "O nweghị onye ọbụla Onyenwe anyị."

Jisọs sịrị ya, "Mụ onwe m amakwaghị gị ikpe: Gawa, kama emehiekwala ọzọ."

Armadilhas e consequências

Os lábios da mulher estranha destilam mel, mas o seu fim é amargo. Fuja da imoralidade — o adultério escraviza.

Nʼihi na egbugbere ọnụ nwanyị na-akwa iko na-atọ ka mmanụ aṅụ,

okwu ọnụ ya na-akwọ mụrụmụrụ karịa mmanụ.

Ma nʼikpeazụ, na-elu ilu dịka oluilu

dịkwa nkọ ka mma agha ihu abụọ.

Ụkwụ ya abụọ na-arịdaru nʼọnwụ,

nzọ ụkwụ ya abụọ na-eje nʼụzọ ọkụ ala mmụọ.

Nʼihi na dịghị agbaso ụzọ kwesiri ndụ;

ụzọ ya gbagọrọ agbagọ, ma maghị nke a.

Nʼihi na egbugbere ọnụ nwanyị na-akwa iko na-atọ ka mmanụ aṅụ,

okwu ọnụ ya na-akwọ mụrụmụrụ karịa mmanụ.

Ma nʼikpeazụ, na-elu ilu dịka oluilu

dịkwa nkọ ka mma agha ihu abụọ.

Ụkwụ ya abụọ na-arịdaru nʼọnwụ,

nzọ ụkwụ ya abụọ na-eje nʼụzọ ọkụ ala mmụọ.

Nʼihi na dịghị agbaso ụzọ kwesiri ndụ;

ụzọ ya gbagọrọ agbagọ, ma maghị nke a.

Ugbu a ụmụ m, geenụ m ntị,

unu esikwala nʼokwu niile nke ọnụ m wezuga onwe unu.

Gbaara nwanyị dị otu a ọsọ!

Ejekwala ọnụ ụzọ ụlọ ya nso,

ka ghara ire ugwu gị nʼebe ndị ọzọ nọ,

maọbụ were ndụ gị tinye nʼaka ndị na-enweghị obi ebere.

Gbaara nwanyị dị otu a ọsọ!

Ejekwala ọnụ ụzọ ụlọ ya nso,

ka ghara ire ugwu gị nʼebe ndị ọzọ nọ,

maọbụ were ndụ gị tinye nʼaka ndị na-enweghị obi ebere.

Ka ndị ọbịa ghara inwe oke oriri nʼelu akụ gị,

ka ihe niile dọgburu onwe gị nʼọrụ ịkpata gharakwa imejupụta ụlọ onye ọzọ.

Ka gharakwa ịsụ ude nʼikpeazụ

mgbe ọrịa ga-eripịa ọkpụkpụ gị na anụ ahụ gị.

Mgbe ga-asị, Lee ka m si kpọọ ịdọ aka na ntị asị!

"Leekwa ka obi m si lelịa iba mba anya!

Egeghị m ntị nʼozizi nke ndị nkuzi m

maọbụ nabata ndụmọdụ nke ndị ndụmọdụ m.

Nʼihi na ugbu a, abịaruola m na mbibi

nʼihu ọha mmadụ niile."

Nne anụ nke na-ahụ nʼanya, dịka ele mara mma,

ka ara dị ya nʼobi zuore gị,

ka ịhụnanya ya na-enye gị obi ụtọ mgbe ọbụla.

Gịnị ka na-achọ nʼahụ nwanyị na-akwa iko?

Gịnị mere i ji na-amaku nwunye onye ọzọ obi?

Ụlọ nwanyị dị otu a dị nʼokporoụzọ

nke na-eduba nʼọnwụ na nʼọkụ ala mmụọ.

Ndị ikom niile banyere nʼụlọ ha na-ala nʼiyi.

Ha adịghị alọtakwa nʼokporoụzọ nke na-eduba na ndụ.

Ọnụ nwanyị na-akwa iko bụ oke olulu,

nwoke nọ nʼokpuru oke iwe Onyenwe anyị na-adaba nʼime ya.

Gbaaranụ mmehie ịkwa iko ọsọ. dịghị mmehie ọzọ na-emetụta anụ ahụ mmadụ dịka mmehie ịkwa iko. bụ mmehie mmadụ na-eme megide anụ ahụ ya.

Ana m agwa unu nke a: na-adịnụ ndụ nke Mmụọ Nsọ na-achị, unu anọkwala nʼọchịchọ nke anụ ahụ. Nʼihi na ihe anụ ahụ chọrọ dị iche nʼihe Mmụọ Nsọ chọrọ. Ihe Mmụọ Nsọ chọrọ dịkwa iche nʼihe anụ ahụ chọrọ. Ịgba mgba dị nʼetiti ha na-eme ka hapụ inwe ike mee ihe chọrọ ime.

Ugbu a, ọrụ nke anụ ahụ pụtara ihe: ịkwa iko, adịghị ọcha na agụụ ịkwa iko. Ikpere arụsị, iri amụsụ, ibu iro nʼobi, na ịlụ ọgụ, ekworo na iwe, ịkpa iche iche, nkewa, ịhọ otu. Ịkpọ asị, igbu ọchụ, ịṅụbiga mmanya oke, oke oriri na ihe ndị ọzọ yiri ha. Ana m adọ unu aka na ntị dịka m gwara unu nʼoge gara aga, ndị na-eme ihe dị otu a agaghị abanye nʼalaeze Chineke.

Ka ọlụlụ dị na nwunye bụrụ ihe onye ọbụla na-akwanyere ugwu, ka ihe ndina unu bụrụkwa nke a na-emerụghị emerụ. Nʼihi na Chineke ga-ekpe ndị na-akwa iko na ndị ụrụ ikpe.

Nʼihi na nke a bụ ọchịchọ Chineke, bụ dị nsọ unu. Ka unu wezuga onwe unu site na ịkwa iko, ka onye ọbụla nʼime unu mata ido ahụ nke onwe ya nʼugwu na nʼịdị nsọ. bụghị nʼụzọ imejupụta ọchịchọ ọjọọ nke anụ ahụ dị ka ndị mba ọzọ na-amaghị Chineke.

Ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi! bụ na unu amaghị na unu na ụwa bụrụ enyi, unu ga-esi otu a bụrụ ndị iro Chineke? Onye ọbụla nke chọrọ ịbụ enyi nke ụwa, na-eme onwe ya onye iro nke Chineke.

Enyela m ya ohere ka o si na mmehie ya chegharịa, ma jụrụ ichegharị site na ndụ ịkwa iko. Lee, aga m etinye ya nʼute ahụhụ, meekwa ka ndị ya na ha na-akwa iko taa ahụhụ dị ukwuu. bụ naanị ma ha chegharịrị ka ihe ndị a na-agaghị abịakwasị ha.

Seja o primeiro
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-07-05_19-25-13-