Pular para o conteúdo
Publicidade

Guardar o coração

Por Bíblia Online

Guardar o coração é o mandamento mais urgente de Provérbios. Sobre tudo o que se deve guardar, guarda o teu coração, porque dele procedem as fontes da vida.

Sobre tudo, guarda o coração

O coração é a nascente de tudo — pensamentos, desejos, decisões. Guardá-lo é proteger toda a vida espiritual e emocional.

Nke ka nke, lezie echiche uche gị niile anya,

nʼihi na ha na-emetụta ndụ gị niile.

Okwu nke iri na asatọ

Nwa m, nye m obi gị

ka ụzọ m niile nyekwa anya gị ọṅụ.

Amamihe na-eweta ahụ ike

Nwa m echezọla ihe niile m ziri gị.

Ma debe iwu m nʼobi gị.

Nʼihi na ha ga-eme ka ndụ gị dị ogologo ruo ọtụtụ afọ,

wetakwara gị udo na ọganihu.

Ezi mmadụ na-esite nʼakụ ọma juru ya obi na-arụpụta ezi ọrụ, otu a kwa, ajọ mmadụ na-esite nʼobi ọjọọ ya na-arụpụta ajọ ọrụ. Nʼihi na ihe ọbụla dị mmadụ nʼobi bụ ihe na-apụta nʼọnụ ya.

Coração puro e renovado

Cria em mim um coração puro, ó Deus. Os puros de coração verão a Deus — e o Espírito renova nosso interior.

Kee obi dị ọcha nʼime m, O Chineke,

nwogharịa ezi mmụọ nʼime m.

Ngọzị na-adịrị ndị dị ọcha nʼobi,

nʼihi na ha ga-ahụ Chineke anya.

O Chineke, nyochaa m, mara obi m.

Nwaa m, matakwa echiche uche m niile.

Chọpụta ma o nwere ihe ọjọọ dị nʼime m,

ma duo m nʼụzọ ebighị ebi.

Tulee m, O Onyenwe anyị, ma nwakwaa m,

nyochaa obi m na echiche m.

Nʼihi na ejirila m ịhụnanya gị mere ihe nlere anya nye onwe m.

Ana m ejegharịkwa nʼime eziokwu gị.

bụ ezie na nyochaala obi m,

i letala m nʼabalị, nwalekwaa m,

ga-achọpụta na o nweghị ihe ọjọọ bụla m zubere,

na ọnụ m ekwuhiebeghị.

Ndị mmadụ agbalịala inye m ngarị

ma anaghị m ekwe ka mụ na ndị na-eme ihe ike nwee mmekọrịta

nʼihi iwu sitere nʼegbugbere ọnụ gị.

Nzọ ụkwụ m akpafubeghị site nʼụzọ gị,

ụkwụ m agbụchapụghịkwa site nʼọnọdụ ya.

Obi m dị njikere, o Chineke,

obi m dị njikere sikwaa ike;

aga m abụ abụ, kụkwaa egwu.

Guardar com a Palavra

Não vos conformeis com este mundo. A Palavra de Deus guardada no coração nos protege do pecado e nos direciona.

Unu eyila ụwa nke a, kama bụrụnụ ndị enwoghara site nʼịgbanwe uche unu. Mgbe ahụ, unu ga-enwe ike nwapụta ihe bụ uche Chineke na ihe na-achọ, nke bụ ezi ihe, nke na-atọ ya ụtọ na nke zukwara oke.

Esitela nʼọnụ gị wezuga ihe dị nʼAkwụkwọ Iwu a. Kama na-atụgharị uche gị na ya ehihie na abalị, ka i si otu a lezie anya imezu ihe niile e dere nʼime ya. Mgbe ahụ ga-aba ụba, ihe ga-agakwara gị nke ọma.

Eji m obi m niile na-achọsi gị ike.

Ekwela ka m kpafuo site nʼihe niile i nyere nʼiwu.

Ezoola m okwu gị niile nʼobi m,

igbochi m imehie imegide gị.

Were obi gị niile, na mkpụrụobi gị niile, na uche gị na ike gị niile, hụ Onyenwe anyị Chineke gị nʼanya. Iwu ndị a m na-enye gị taa ka ga-eme ka dịrị gị nʼobi.

gwara ha okwu ndị a sị, "Na-atụgharịnụ uche nʼokwu niile m kwupụtara nye unu taa, ka unu si otu a nyefeekwa ya nʼaka ụmụ unu, ka ha onwe ha lezie anya debe okwu niile dị nʼiwu ndị a.

Vigilância e paz

A paz de Deus guarda nossos corações em Cristo Jesus. Chegai-vos a Deus, purificai os corações — e Ele estará convosco.

Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọbụla. Kama nʼihe niile, sitenụ nʼekpere na arịrịọ, ya na ekele, chee ihe niile na-akpa unu nʼihu Chineke. Udo Chineke, nke dị ukwuu karịa ihe ọbụla mmadụ nwere ike ịghọta, ga-eche echiche uche unu na obi unu nche nʼime Kraịst Jisọs.

Bịakwutenụ Chineke nso, ya onwe ya ga-abịakwutekwa unu nso. Kwọọnụ aka unu, unu ndị mmehie, meekwanụ ka obi unu dị ọcha, unu ndị obi abụọ.

Unu onwe unu kwesikwara inwe ndidi guzosiekwa ike nʼihi na ọbịbịa Onyenwe anyị dị nso.

Ibi ndụ ọhụ site nʼike Kraịst

Ya mere, ebe e mere ka unu bụrụ ndị so Kraịst bilie nʼọnwụ, tụkwasịnụ obi unu nʼihe dị nʼeluigwe ebe Kraịst nọ nʼakụkụ aka nri Chineke.

Seja o primeiro