Pular para o conteúdo
Publicidade

Salmos 57

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nke olu abụ "E bibikwala" Devid. Abụ miktam. Mgbe gbapụrụ ga biri nʼime ọgba nkume nʼihi Sọl.

Ntụkwasị obi nʼime Chineke

1 Meere m ebere, O Chineke, meere m ebere,

nʼihi na bụ gị ka mkpụrụobi m ji mere ebe mgbaba.

bụ na ndo nke nku gị abụọ ka m ga-agbaba

tutuu ihe mbibi ndị a agafesịa.

2 Aga m akpọku Chineke nke kachasị ihe niile elu,

Chineke na-emezuru m ihe niile na-akpa m mkpa.

3 na-esite nʼeluigwe zidata inyeaka ma zọpụta m

na-abara ndị ahụ ji ike na-achụ m mba; Sela

Chineke na-ezite ịhụnanya ya na ikwesi ntụkwasị obi ya.

4 Anọ m nʼetiti ọtụtụ ọdụm;

amanyere m ka m dina nʼetiti ajọ anụ ọhịa,

ụmụ mmadụ ndị eze ha dị nkọ dịka àkụ na ùbe,

ire ha dịkwa nkọ dịka mma agha.

5 O Chineke, ka e bulie gị elu karịa eluigwe niile;

ka ebube gị dị nʼelu ụwa niile.

6 Ha gbasaara ụkwụ m ụgbụ,

ihe mgbu nyịturu m.

Ha egwuola olulu nʼụzọ m si agafe,

ma ha onwe ha adabala nʼime ya. Sela

7 Obi m dị njikere, o Chineke,

obi m dị njikere sikwaa ike;

aga m abụ abụ, kụkwaa egwu.

8 Teta nʼụra mkpụrụobi m!

Teta, ụbọ akwara na une!

Aga m akpọte chi ọbụbọ.

9 O Onyenwe anyị, aga m eto gị nʼetiti mba niile;

aga m abụ abụ banyere gị nʼetiti ndị niile dị iche iche.

10 Nʼihi na ịhụnanya gị dị ukwuu na-eru na mbara eluigwe;

ikwesi ntụkwasị obi gị na-erukwa mbara eluigwe.

11 O Chineke, ka e bulie gị elu karịa eluigwe;

ka ebube gị dị nʼelu ụwa niile.

Veja também