Publicidade

Louvor e adoração

Por Bíblia Online

O louvor e a adoração são o propósito supremo da vida cristã. A Bíblia está repleta de exortações a louvar o Senhor — com cânticos, instrumentos, danças e com todo o nosso ser.

Louvai ao Senhor!

Todo ser que respira louve ao Senhor! O louvor é o sacrifício agradável que oferecemos continuamente a Deus.

Ka ihe niile na-eku ume too Onyenwe anyị.

Toonu Onyenwe anyị.

Ka ihe niile too Onyenwe anyị

Toonu Onyenwe anyị.

Toonu Chineke nʼime ụlọnsọ ya.

Toonu ya, na mbara igwe nke ike ya.

Toonu ya, nʼihi ọrụ niile rụrụ site nʼike ya.

Toonu ya, nʼihi ịdị ukwuu ya nke kachasị ịdị ukwuu niile.

Werenụ opi ike too ya,

werekwanụ ụbọ akwara na une too ya,

jirinụ ihe iti egwu na ite egwu too ya,

jirikwanụ ụbọ akwara dị iche iche na ọja too ya,

werenụ ogene too ya,

werekwanụ ogene na-ada oke ụda too ya.

Ka ihe niile na-eku ume too Onyenwe anyị.

Toonu Onyenwe anyị.

jirinụ ihe iti egwu na ite egwu too ya,

jirikwanụ ụbọ akwara dị iche iche na ọja too ya,

Ka ha jiri ite egwu too aha ya

ka ha jiri ọyọ na ụbọ akwara kpọọrọ ya egwu.

Abụ otuto

Toonu Onyenwe anyị!

Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ.

Bụọnụ abụ ito ya nʼetiti ndị nsọ ya.

Ka ha jiri ite egwu too aha ya

ka ha jiri ọyọ na ụbọ akwara kpọọrọ ya egwu.

Nʼihi na ihe banyere ndị ya na-atọ Onyenwe anyị ụtọ.

na-eji nzọpụta kpukwasị ndị dị umeala nʼobi nʼisi dịka okpueze.

Ka ndị nsọ ṅụrịa ọṅụ nʼime nsọpụrụ a,

bụkwaa abụ nʼihi ọṅụ nʼelu ihe ndina ha.

Toonu Onyenwe ihe niile

Toonu Onyenwe anyị.

Toonu Onyenwe anyị site nʼeluigwe,

toonu ya nʼebe niile kachasị elu.

Toonu ya, ndị mmụọ ozi ya niile,

toonu ya, unu usuu ndị agha ya niile.

Toonu ya, anyanwụ na ọnwa

toonu ya, kpakpando niile.

Toonu ya, unu eluigwe kachasị elu

na unu mmiri dị nʼelu mbara eluigwe.

Ka ha niile too aha Onyenwe anyị,

nʼihi na ha niile malitere ịdị site nʼokwu ọnụ ya.

O doro ha nʼọnọdụ ha ga-anọ ruo mgbe ebighị ebi;

o nyere iwu nke a na-agaghị agabiga.

Toonu Onyenwe anyị, site nʼụwa,

unu oke anụ mmiri niile na ogbu mmiri niile,

na amụma, na mkpụrụ mmiri, na snoo na igwe ojii niile,

na oke ifufe niile na-eme ihe o nyere nʼiwu,

unu ugwu ukwu niile, na ugwu nta niile

na osisi niile na-amị mkpụrụ na osisi sida niile

na anụ ọhịa, na anụ ụlọ niile,

na ihe niile na-akpụ akpụ nʼala na nnụnụ niile,

ndị eze niile nke ụwa na mba niile dị iche iche,

unu ụmụ eze na ndị niile na-achị achị nʼụwa,

ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọ,

ndị okenye na ụmụntakịrị.

Ka ha niile too aha Onyenwe anyị,

nʼihi na bụ naanị aha ya ka e buliri elu;

ebube ya dị ukwuu karịa eluigwe na ụwa.

Site na ya, ka anyị na-achụrụ Chineke aja otuto mgbe niile, nke bụ mkpụrụ egbugbere ọnụ nke na-ekwupụta aha ya.

Site na ya, ka anyị na-achụrụ Chineke aja otuto mgbe niile, nke bụ mkpụrụ egbugbere ọnụ nke na-ekwupụta aha ya.

Louvor como estilo de vida

Bendirei ao Senhor em todo tempo; o seu louvor estará sempre nos meus lábios. O louvor não depende de circunstâncias.

Chineke dị mma

Aga m eto Onyenwe anyị mgbe niile.

Mgbe niile ka otuto ya ga-adị nʼọnụ m.

Chineke dị mma

Aga m eto Onyenwe anyị mgbe niile.

Mgbe niile ka otuto ya ga-adị nʼọnụ m.

Chineke dị mma

Aga m eto Onyenwe anyị mgbe niile.

Mgbe niile ka otuto ya ga-adị nʼọnụ m.

Mkpụrụobi m ga-anya isi na Onyenwe anyị;

ka ndị niile a na-akpagbu gee ntị ṅụrịa ọṅụ.

Soro m too Onyenwe anyị;

ka anyị bulie aha ya elu.

Ma mụ onwe m ga-anọgide na-enwe olileanya mgbe niile;

aga m eto gị mgbe niile karịa otu m toro gị na mbụ.

bụ gị ka m tụkwasịrị obi, site nʼoge amụrụ m;

gị onwe gị wepụtara m site nʼafọ nne m.

Aga m anọgide na-eto gị.

Ọnụ m jupụtara nʼotuto gị,

na-ekwupụta ịma mma gị ogologo ụbọchị niile.

Ọnụ m jupụtara nʼotuto gị,

na-ekwupụta ịma mma gị ogologo ụbọchị niile.

Egbugbere ọnụ m ga-eti mkpu ọṅụ

mgbe m na-abụku gị abụ otuto,

mụ, onye gbapụtara.

Site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda ya,

aha Onyenwe anyị ga-abụ ihe a na-eto eto.

Na-enyenụ ekele mgbe niile banyere ihe niile, nʼihi na nke a bụ ọchịchọ Chineke banyere unu ndị bụ nke Kraịst Jisọs.

Adoração em espírito e verdade

Os verdadeiros adoradores adorarão ao Pai em espírito e em verdade. Deus busca os que o adoram com coração sincero.

Ma oge na-abịa, ugbu a bịala, mgbe ndị na-efe Nna ahụ nʼeziokwu ga-efe ya nʼime mmụọ na nʼeziokwu. Nʼihi na bụ ndị dị otu a ka Nna chọrọ ka ha na-efe ya.

Chineke bụ mmụọ ndị niile na-efe ya ga-eferịrị ya nʼime mmụọ na eziokwu."

Toonu Onyenwe anyị

Bịanụ ka anyị jiri ọṅụ bụkuo Onyenwe anyị abụ;

ka anyị tikuo oke nkume nzọpụta anyị mkpu ọṅụ.

Ka anyị jiri ekele bịakwute ya

jirikwa iti egwu na ịbụ abụ jaa ya mma.

Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke dị ukwuu,

eze ukwuu kachasị chi niile elu.

Ebe niile michasịrị emi nke ụwa dị nʼaka ya,

ebe kachasị elu nke ugwu niile bụkwa nke ya.

Osimiri niile bụ nke ya, nʼihi na bụ ya kere ha,

aka ya kpụrụ ala akọrọ niile.

Bịanụ ka anyị kpọọ isiala nʼofufe,

ka anyị gbuo ikpere nʼala nʼihu Onyenwe anyị, onye kere anyị;

Toonu Chineke

Tikusienụ Onyenwe anyị mkpu ọṅụ ike, ụwa niile.

Jiri obi ụtọ fee Onyenwe anyị ofufe;

jirinụ ịbụ abụ ọṅụ bịa nʼihu ya

Jiri obi ụtọ fee Onyenwe anyị ofufe;

jirinụ ịbụ abụ ọṅụ bịa nʼihu ya

Jirinụ ekele banye nʼọnụ ụzọ ama ya

jiri otuto baa nʼogige ya;

keleenụ ya, tookwa aha ya.

Kpọọnụ isiala nye Onyenwe anyị

Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ,

bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, unu ụwa niile.

Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, toonu aha ya;

kwupụtanụ nzọpụta ya site nʼotu ụbọchị ruo nʼụbọchị nke ọzọ.

Kwusaanụ ebube ya nʼetiti mba niile,

kọsakwanụ banyere oke ọrụ ya niile nʼetiti ndị niile dị iche iche.

Nʼihi na Onyenwe anyị dị ukwuu, bụrụkwa onye kwesiri ịnata otuto;

onye a na-atụ egwu karịa chi ọzọ niile ka bụkwa.

Nʼihi na chi niile nke mba niile dị iche iche bụ arụsị efu,

maọbụ Onyenwe anyị kere eluigwe niile.

Ịma mma na ebube dị nʼihu ya;

ike na otuto dị nʼebe nsọ ya.

Nyenụ Onyenwe anyị, unu ezinaụlọ nke mba niile dị iche iche,

nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ na ike.

Nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ ruuru aha ya;

werenụ onyinye bata nʼime ogige ya.

Kpọọnụ isiala nye Onyenwe anyị nʼịma mma nke ịdị nsọ ya;

maa jijiji nʼihu ya, unu ụwa niile.

A grandeza de Deus

Grande é o Senhor e mui digno de louvor! Sua grandeza é insondável. Os céus declaram sua glória e toda a criação o adora.

Onyenwe anyị dị ukwuu, bụrụkwa onye kwesiri ịnata otuto;

ịdị ukwuu ya karịrị ihe onye ọbụla pụrụ ịghọta.

Nʼezie, i nọ nʼocheeze gị dịka Onye ahụ dị Nsọ;

bụ otuto ndị Izrel.

Aga m ekwupụta aha gị nye ụmụnna m;

nʼetiti ọha mmadụ aga m enye gị otuto.

Toonu Onyenwe anyị! Unu niile bụ ndị na-atụ egwu ya;

unu bụ ndị agbụrụ Jekọb, sọpụrụnụ ya!

Tụọnụ ya egwu, unu agbụrụ Izrel!

Nʼihi na o ledaghị ahụhụ onye a na-akpagbu anya

maọbụ kwaa ya emo;

o lefughị ya anya

kama mgbe kpọkuru ya, nụrụ olu akwa ya.

Onyenwe anyị dike, na onye amara

Toonu Onyenwe anyị!

bụ ihe dị mma ịbụku Chineke anyị abụ otuto.

bụ ihe na-eweta mmasị, bụrụkwa ihe ziri ezi ito ya!

Toonu Onyenwe anyị, nʼihi na Onyenwe anyị dị mma;

bụkuo aha ya abụ otuto, nʼihi na bụ ihe ziri ezi.

Chineke onye na-achị ihe niile

Onyenwe anyị bụ eze, ka ụwa niile nwee obi ụtọ;

ka ndị niile bi nʼebe dị anya ṅụrịa.

Ṅụrịanụ ọṅụ nʼime Onyenwe anyị, unu ndị ezi omume,

tookwanụ aha nsọ ya.

"Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị! Nke a bụkwa aha m.

Agaghị m enye onye ọzọ ugwu na nsọpụrụ m.

Mụ na arụsị a pịrị apị agakwaghị azọ otuto m.

Cânticos e instrumentos

Cantai ao Senhor um cântico novo! Louvai com salmos, hinos e cânticos espirituais, fazendo melodia no coração ao Senhor.

Ka okwu nke Kraịst biri nʼime unu nʼuju ya. Werenụ amamihe niile na-akụzirịta ibe unu ihe, ma na-adụrịtakwa ibe unu ọdụ. Werekwanụ abụ ọma na abụ nke ime mmụọ bụọrọ Chineke abụ ekele nʼobi unu.

Ka okwu nke Kraịst biri nʼime unu nʼuju ya. Werenụ amamihe niile na-akụzirịta ibe unu ihe, ma na-adụrịtakwa ibe unu ọdụ. Werekwanụ abụ ọma na abụ nke ime mmụọ bụọrọ Chineke abụ ekele nʼobi unu.

werenụ abụ ọma, na abụ nke ime mmụọ na-ekwe ukwe nʼetiti onwe unu. Werekwanụ obi unu niile na-abụrụ Onyenwe anyị abụ dị ụtọ. Na-enyenụ Chineke bụ Nna ekele mgbe niile na nʼihe niile, nʼaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.

Ịdị mma na ịdị ukwuu Onyenwe anyị

Tienụ mkpu ọṅụ nye Onyenwe anyị, unu ndị ezi omume;

nʼihi na bụ ihe ziri ezi ka ndị obi ha ziri ezi too ya.

Werenụ ụbọ akwara too Onyenwe anyị;

werenụ une nke nwere akwara iri kpọọrọ ya egwu.

Bụkuonụ ya abụ ọhụrụ;

were ǹka kpọọ ụbọ akwara ma tiekwa mkpu ọṅụ.

Devid na ndị Izrel niile weere ike ha niile na-aṅụ ọṅụ nʼihu Chineke, jiri abụ, ụbọ akwara, opi, une na ogene na iti egwu na-etekwa egwu.

Bụkuonụ ya abụ, bụkuonụ ya abụ otuto;

kwupụtaranụ mba niile ọrụ ebube ya niile.

O tinyere abụ ọhụrụ nʼọnụ m,

abụ otuto nye Chineke anyị.

Ọtụtụ ga-ahụ ya ma tụọ egwu,

ha ga-atụkwasị obi ha nʼime Onyenwe anyị.

Ekele maka ịdị mma Chineke

bụ ihe ziri ezi ito Onyenwe anyị,

na iti egwu nye aha gị, gị Onye kachasị ihe niile elu,

Nkwa eze

Aga m abụ abụ banyere ịhụnanya gị na ikpe gị ziri ezi;

o Onyenwe anyị, bụ gị ka m ga-abụku abụ otuto.

Nkwa eze

Aga m abụ abụ banyere ịhụnanya gị na ikpe gị ziri ezi;

o Onyenwe anyị, bụ gị ka m ga-abụku abụ otuto.

Louvor nas lutas

Paulo e Silas louvaram na prisão e houve terremoto. O louvor é arma espiritual que transforma circunstâncias e derrota o inimigo.

Nʼetiti abalị, mgbe Pọl na Saịlas na-ekpe ekpere na-abụkwa abụ ito Chineke, ndị niile nọ nʼụlọ mkpọrọ ahụ na-ege ha ntị.

Nʼetiti abalị, mgbe Pọl na Saịlas na-ekpe ekpere na-abụkwa abụ ito Chineke, ndị niile nọ nʼụlọ mkpọrọ ahụ na-ege ha ntị.

Mgbe ya na ndị ya gbasịrị izu, Jehoshafat họpụtara ndị ikom ndị ga-eji abụ too Onyenwe anyị nʼihi ebube ya na ịdị nsọ ya. Mgbe ha na-aga nʼihu ndị agha, ha na-abụ abụ na-asị:

"Nyenụ Onyenwe anyị ekele,

nʼihi na ịhụnanya ya na-adịgide ruo ebighị ebi."

Mgbe ndị Juda malitere ịbụ abụ na ito otuto, Onyenwe anyị cheere ndị agha Amọn na nke ndị Moab, na ndị nke si nʼugwu Sia nʼụzọ, merie ha.

Mgbe Job nụrụ ihe ndị a, o sitere nʼebe nọ bilie ọtọ, dọwaa uwe ya, kpụchaa agịrị isi ya, dara nʼala ma kpọọ isiala, kwuo sị:

"Ọtọ ka m gba mgbe m si nʼafọ nne m pụta

nʼọnọdụ ịgba ọtọ ka m ga-eji laghachikwa.

Onyenwe anyị nyere ihe niile, Onyenwe anyị ewerekwala ihe niile,

ka aha Onyenwe anyị bụrụ ihe a gọziri agọzi."

Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, unu ndị nsọ ya,

toonu aha nsọ ya.

Iwe ya adịghị adịgide tee anya,

ma ime amara ya na-adị ruo ebighị ebi!

Ịkwa akwa nwere ike dịrị ogologo abalị niile,

ma iti mkpu ọṅụ ga-adị nʼụtụtụ.

I meela ka iti mkpu akwa m ghọọ ite egwu;

napụrụ m akwa mkpe m, ma yinye m ọṅụ dịka akwa mmemme.

I mere nke a ka obi m bụọ maka otuto gị, ghara ịnọ nwayọọ.

O Onyenwe anyị Chineke m, aga m eto gị ruo mgbe ebighị ebi.

O mkpụrụobi m, gịnị mere i ji daa mba?

Gịnị mere i ji na-asụ ude nʼime m?

Nwee olileanya na Chineke,

nʼihi na m ka ga-eto ya ọzọ,

Onye nzọpụta m na Chineke m.

Nehemaya gwakwara ha sị; "Laanụ nʼụlọ unu gaa mee mmemme oriri na ọṅụṅụ nyekwanụ ndị na-enweghị nke ha ga-eri. Ụbọchị taa dị nsọ nye Chineke anyị. Unu erukwala ụjụ, nʼihi na ọṅụ Onyenwe anyị bụ ike unu."

Gratidão e louvor

Em tudo dai graças. O louvor nasce da gratidão por quem Deus é e pelo que Ele faz. Cada bênção é motivo de adoração.

Gọzie Onyenwe anyị

Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị;

ka ihe niile dị nʼime m too aha nsọ ya.

Gọzie Onyenwe anyị

Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị;

ka ihe niile dị nʼime m too aha nsọ ya.

Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị;

echefukwala mmeso ọma ya niile,

Gọzie Onyenwe anyị

Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị;

ka ihe niile dị nʼime m too aha nsọ ya.

Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị;

echefukwala mmeso ọma ya niile,

bụ ya na-agbaghara gị mmehie gị niile;

na-agwọkwa gị ọrịa gị niile,

onye na-agbapụta ndụ gị site nʼolulu

werekwa ịhụnanya na ọmịiko kpukwasị gị dịka okpueze,

Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị;

echefukwala mmeso ọma ya niile,

Ka ha kelee Onyenwe anyị nʼihi ịhụnanya ya nke na-adịghị agwụ agwụ

na nʼihi ọrụ ebube ya niile nye ụmụ mmadụ,

nʼihi na o jirila ọtụtụ ezi ihe nyejuo ndị agụụ na-agụ afọ

meekwa ka onye akpịrị na-akpọ nkụ ṅụjuo afọ.

Toonu Chineke onye na-edebe ọgbụgba ndụ

Nyenụ Onyenwe anyị otuto, kwupụtakwa aha ya.

Meenụ ka amata nʼetiti mba niile banyere ihe niile rụrụ.

Nʼụbọchị ahụ, ga-ekwukwa sị,

"Nyenụ Onyenwe anyị otuto, Kwupụtakwa aha ya;

meenụ ka amata nʼetiti mba niile ihe niile rụrụ;

kwusaanụ na aha ya bu ihe e buliri elu.

Toonu Onyenwe anyị

O Onyenwe anyị, bụ Chineke m;

aga m ebuli gị elu, nye aha gị otuto,

nʼihi na site na ntụkwasị obi zuruoke,

rụọla ọtụtụ ihe ịrịbama,

nke i tụrụ atụmatụ ha siterị nʼoge gara aga.

Ana m ekele gị, na-etokwa gị, Chineke nke nna m ha,

nʼihi na i nyela m amamihe na ike.

I meela ka m mata ihe anyị rịọrọ gị,

i mekwala ka anyị mata nrọ ahụ eze rọrọ."

A majestade do Rei

Ao nome de Jesus todo joelho se dobrará. A adoração culminará na eternidade, onde os redimidos louvarão ao Cordeiro para sempre.

Ha na-abụ abụ nʼoke olu na-asị,

"O kwesiri bụ Nwa Atụrụ ahụ e gburu egbu

ịnara ike na akụnụba na amamihe na ike

na nsọpụrụ na otuto na ngọzị."

Mgbe ahụ, anụrụ m ka ihe niile nọ nʼeluigwe na ndị nọ nʼụwa na ndị nọ nʼokpuru ụwa, na ndị nọ nʼokpuru oke osimiri na-eti mkpu abụ na-asị,

"Ka ngọzị, na nsọpụrụ niile, na otuto niile, na ike niile

dịrị onye ahụ na-anọkwasị nʼocheeze ahụ, na Nwa Atụrụ ahụ

ruo mgbe niile ebighị ebi!"

O jiri oke olu kwuo sị, "Tụọnụ egwu Chineke, nyekwanụ ya otuto, nʼihi na oge ikpe ya eruola. Kpọọkwanụ isiala nye ya, bụ onye kere eluigwe na ala, na oke osimiri na isi iyi mmiri niile."

Otu olu sitekwara nʼocheeze ahụ na-asị,

"Toonu Chineke anyị,

unu ndị ohu ya niile,

ndị ukwu na ndị nta,

unu ndị na-atụ egwu ya."

Otu olu sitekwara nʼocheeze ahụ na-asị,

"Toonu Chineke anyị,

unu ndị ohu ya niile,

ndị ukwu na ndị nta,

unu ndị na-atụ egwu ya."

E dere ya,

" Nʼezie, dịka m na-adị ndụ,ka Onyenwe anyị kwuru,

ikpere niile ga-egbu nʼihu m;

ire niile ga-ekwupụtakwa Chineke.’ "

Nʼikpeazụ, ụmụnna m, na-echenụ echiche mgbe niile banyere ihe bụ eziokwu, na ihe dị mma, na ihe ziri ezi. Na-echekwanụ echiche banyere ihe dị ọcha, ihe ọbụla mabigara mma oke, ihe ọbụla dị mma na ndụ onye ọbụla nke e kwesiri ịṅomi, na nke e kwesiri inwe otuto nʼihi ya.

Vida de louvor

O louvor transforma, fortalece a fé e nos conecta com o céu. Quem louva a Deus em toda circunstância experimenta sua presença real.

Jirinụ ịtụ egwu fee Onyenwe anyị ofufe;

jirikwanụ ịma jijiji ṅụrịa ọṅụ nʼihu ya.

Aga m enye Onyenwe anyị ekele nʼihi ezi omume ya,

aga m abụku aha Onyenwe anyị, Onye kachasị ihe niile elu abụ otuto.

Ekele nʼihi nnapụta Chineke

O Onyenwe anyị, aga m esite nʼala ala obi m too gị,

aga m agwakwa onye ọbụla ihe ọma niile na-eme.

Ekele nʼihi nnapụta Chineke

O Onyenwe anyị, aga m esite nʼala ala obi m too gị,

aga m agwakwa onye ọbụla ihe ọma niile na-eme.

Obi ga-atọ m ụtọ; obi m ga-ejupụta nʼọṅụ nʼihi gị,

aga m abụrụ gị abụ otuto, gị Onye kachasị ihe niile elu.

Toonu Onyenwe anyị,

nʼihi na o gere ntị nʼarịrịọ m rịọrọ ya ka o meere m ebere.

Onyenwe anyị bụ ike m na ọta m;

ana m atụkwasị ya obi m, si otu a bụrụ onye a na-enyere aka.

Obi m na-awuli elu nʼihi ọṅụ,

aga m ejikwa abụ m na-eto ya.

Onye na-eji ekele achụrụ m aja, na-asọpụrụ m,

bụkwa onye na-edozi ụzọ ya, ka m ga-eme ka hụ nzọpụta Chineke."

Nʼime Chineke onye m na-eto okwu ya,

nʼime Chineke ka m na-atụkwasị obi; ụjọ agaghị atụ m.

Gịnị ka mmadụ efu pụrụ ime m?

O, gị onye bụ ike m, ana m abụku gị abụ otuto;

gị, o Chineke, bụ ebe mgbaba m e wusiri ike,

Chineke m, onye m na-adabere.

Nʼihi na ịhụnanya gị dị mma karịa ndụ,

aga m eji egbugbere ọnụ m jaa gị mma.

Ogologo ụbọchị m niile ka m ga-eto gị,

aga m eweli aka m abụọ elu kpọkuo aha gị.

Ịdị mma na ịdị ike nke Chineke

I kwesiri otuto, O Chineke, nʼime Zayọn;

bụ gị ka anyị ga-emezuru nkwa anyị,

O gị onye na-anụ ekpere,

bụ gị ka mmadụ niile ga-abịakwute,

Mgbe mmehie na-anyịgbu anyị,

gbaghara anyị njehie anyị niile.

Eji m ọnụ m kpọkuo ya;

otuto ya dị m nʼire.

Otuto dịrị Chineke,

onye na-ajụghị ekpere m

maọbụ ghara izi m ịhụnanya ya!

Ka ndị ezi omume bụrụ ndị nwere obi ụtọ,

ma ṅụrịa nʼihu Chineke;

ka ha bụrụ ndị nwere obi ụtọ, jupụtakwa nʼọṅụ.

Bụkuo Chineke abụ, bụkuonụ aha ya abụ otuto,

toonu onye na-agba igwe ojii dịka ịnyịnya,

Onyenwe anyị bụ aha ya, ṅụrịa ọṅụ nʼihu ya.

bụ nna ndị nke na-enweghị nna, onye na-ekpechitere ndị di ha nwụrụ anwụ ọnụ ha,

onye a bụ Chineke, onye bi nʼebe ya dị nsọ.

Bụkuo Chineke abụ, bụkuonụ aha ya abụ otuto,

toonu onye na-agba igwe ojii dịka ịnyịnya,

Onyenwe anyị bụ aha ya, ṅụrịa ọṅụ nʼihu ya.

Otuto dịrị Onyenwe anyị, Chineke anyị, na Onye Nzọpụta anyị,

Onye na-ebu ibu arọ anyị ụbọchị niile. Sela

Ndị a gọziri agọzi ka ndị ahụ bụ ndị na-eji olu iti mkpu ọṅụ na-abụku gị abụ,

ndị na-ejegharịkwa nʼìhè nke ihu gị, O Onyenwe anyị.

Nyenụ Chineke otuto

bụghị anyị ka dịrị, o Onyenwe anyị, bụghị anyị ka dịrị,

kama bụ aha gị ka ebube na-adịrị,

nʼihi ịhụnanya gị na ikwesi ntụkwasị obi gị.

Too ya nʼihi ịhụnanya ya

Toonu Onyenwe anyị, unu mba niile dị iche iche.

Jaakwa ya mma, unu ndị niile dị iche iche.

Nʼihi na ịhụnanya ya nʼebe anyị nọ dị ukwuu.

Ikwesi ntụkwasị obi Onyenwe anyị na-adịkwa ruo mgbe ebighị ebi.

Toonu Onyenwe anyị!

Aga m eji obi ziri ezi too gị

dịka m na-amụ ihe banyere iwu gị ziri ezi.

bụ gị kpụrụ akụkụ niile dị m nʼahụ.

bụkwa gị jikọtara ha niile ka ha bụrụ otu mmadụ nʼime afọ nne m.

Ana m eto gị nʼihi na abụ m onye e sitere nʼoke egwu na ebube kee;

ọrụ gị niile dị ebube;

amaara m nke a nke ọma.

Abụ nke dike nʼagha

Otuto dịrị Onyenwe anyị, onye bụ oke nkume m,

onye na-ezi aka m abụọ ibu agha,

na mkpịsịaka m ịlụ ọgụ.

Tụkwasị Chineke obi

Toonu Onyenwe anyị.

O mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị.

Aga m eto Onyenwe anyị ogologo ndụ m niile;

aga m abụ abụ otuto nye Chineke m mgbe m nọ na-adị ndụ.

Mmeri na-adị site na Kraịst

Ma ekele dịrị Chineke, onye na-edugharị anyị na-enye anyị mmeri, nʼihi njikọ e jikọtara anyị na Kraịst, onye na-eji anyị arụ ọrụ, ime ka onye ọbụla nụrụ isisi ụtọ nke oziọma ya.

O kpebiri ime anyị ụmụ ya site nʼihi Kraịst Jisọs. Ma o mekwara ihe ndị a niile nʼihi na tọrọ ya ụtọ nʼobi, bụrụkwa ihe o zubere ime. Ka e si otu a too ịdị ebube nke amara ya, nke o ji obi ya niile nye anyị nʼime Onye ahụ hụrụ nʼanya.

Ekpere m bụ ka o site nʼịba ụba nke otuto ya, nye unu ike na-esite na Mmụọ ya, mee ka unu dị ike nʼime mmụọ unu;

Ma unu bụ ndị a họpụtara, otu ndị nchụaja eze, mba dị nsọ, ndị nke Chineke nʼonwe ya, ka unu bụrụ ndị na-ekwusa otuto ya, bụ onye ahụ si nʼọchịchịrị kpọbata unu nʼìhè ya dị ebube.

Ma unu bụ ndị a họpụtara, otu ndị nchụaja eze, mba dị nsọ, ndị nke Chineke nʼonwe ya, ka unu bụrụ ndị na-ekwusa otuto ya, bụ onye ahụ si nʼọchịchịrị kpọbata unu nʼìhè ya dị ebube. Nʼoge gara aga, unu abụghị ndị Chineke, ma ugbu a, unu bụ ndị ya. Na mbụ, unu amaghị ihe ọbụla banyere obi ebere ya, ma ugbu a, obi ebere ya erutela unu aka.

"Akpọkuru m Onyenwe anyị; onye e kwesiri inye otuto.

Azọpụtara m site nʼaka ndị iro m.

Nʼihi nke a, Onyenwe anyị, aga m eto gị nʼetiti mba niile dị iche iche.

Aga m abụku aha gị abụ otuto.

bụ ya bụ onye ga-eto otuto, bụ ya bụ Chineke gị, onye rụrụ gị ọrụ ndị ahụ dị oke egwu na ebube, nke gị onwe gị ji anya gị hụ.

"Geenụ ntị, unu ndị Izrel, taa, unu na-apụ ibuso ndị iro unu agha. Unu atụla egwu. Unu atụla ụjọ. Ka obi unu gharakwa ịda mba.

Site nʼotu ọnụ anyị ka ịja mma na ịbụ ọnụ na-esi apụta. Ụmụnna m, nke a abụghị ihe ziri ezi.

Ma mụ onwe m na-agwa gị, na gị onwe gị bụ Pita. bụkwa nʼelu nkume a ka m ga-ewu ụlọ chọọchị m. Ike niile nke ọkụ ala mmụọ apụghịkwa iguzo megide ya.

Soro m kere oke nʼahụhụ dị ka ezi onye agha Jisọs Kraịst.

dịghị onye agha ọbụla na-ekekọta onwe ya nʼihe nke ụwa a, kama na-achọ ime ihe ga-atọ onye họpụtara ya dị ka onye agha ụtọ.

Na-agbasi mgba ọma nke okwukwe gị ike, jidesiekwa ndụ ebighị ebi ahụ aka ike bụ nke a kpọrọ gị oku maka ya mgbe i mere ezi nkwupụta gị nʼihu ọtụtụ ndị akaebe.

Ana m edere unu ụmụntakịrị,

nʼihi na unu maara nna ahụ.

Ana m edere unu ndị nna,

nʼihi na unu maara onye ahụ na-adị site na mbụ.

Ana m edere unu ụmụ okorobịa,

nʼihi na unu siri ike,

okwu Chineke na-ebikwa nʼime unu,

unu emeriekwala ajọ onye ahụ.

Mmehie na ịla nʼiyi nke ndị ajọ omume

Ndị m hụrụ nʼanya, ebe na-anụ m ọkụ nʼobi idere unu akwụkwọ banyere nzọpụta ahụ anyị nwekọrọ nʼotu, ma ahụrụ m mkpa dị idere unu akwụkwọ a, ịrịọ unu ka unu guzosie ike buo agha ichebe okwukwe ahụ, nke e nyefere ndị nsọ nʼaka idebe.

Ha gara nʼihu na-ezukọta nʼụlọnsọ ukwu ikpe ekpere kwa ụbọchị. Ha na-erikọkwa nri nʼụlọ ha, nʼobi ọṅụ na ekele. Dịka ha gara nʼihu na-eto Chineke, ha nwetara ihuọma nʼaka ndị mmadụ. Onyenwe anyị na-atụkwasịkwara ha ndị a na-azọpụta kwa ụbọchị.

Seja o primeiro
Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-29_22-07-56-