Publicidade

Salmos 147

Onyenwe anyị dike, na onye amara

1 Toonu Onyenwe anyị!

bụ ihe dị mma ịbụku Chineke anyị abụ otuto.

bụ ihe na-eweta mmasị, bụrụkwa ihe ziri ezi ito ya!

2 Onyenwe anyị na-ewu Jerusalem:

na-akpọghachita ụmụ Izrel ndị a dọọrọ nʼagha gaa nʼala ọzọ.

3 na-agwọ ndị niile obi ha tiwara etiwa

na-ekechikọtakwa ebe niile ha merụrụ ahụ.

4 bụ ya na-ekpebi ọnụọgụgụ kpakpando niile

na-akpọkwa ha nʼotu na otu.

5 Onyenwe anyị dị ukwuu, ike ya dịkwa ukwuu;

nghọta ya enweghị nsọtụ.

6 Onyenwe anyị na-agba ndị dị umeala nʼobi ume

ma na-atụda ndị ajọ omume nʼala.

7 Jirinụ ekele bụkuo Onyenwe anyị abụ;

jirinụ ụbọ akwara kpọọrọ Chineke anyị egwu.

8 na-eji igwe ojii na-ekpuchi mbara eluigwe;

na-ewetara elu ụwa mmiri ozuzo

na-eme ka ahịhịa puo nʼelu ugwu niile.

9 na-enye ehi niile nri

na-enyekwa ụmụ ugolọma nri mgbe ha na-ebeku ya akwa nʼihi nri.

10 Mmasị ya adịghị nʼike nke ịnyịnya,

maọbụ nʼike ụkwụ nke mmadụ.

11 Onyenwe anyị na-enwe mmasị nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ,

ndị olileanya ha dị na ịhụnanya ya nke na-adịghị agharịpụ.

12 O Jerusalem, jaa Onyenwe anyị mma;

o Zayọn, too Chineke gị.

13 Nʼihi na o wusiela mkpọrọ ọnụ ụzọ ama gị niile ike,

na-agọzikwa ndị niile bi nʼime gị.

14 na-eme ka oke ala gị nwee udo,

jirikwa ọka wiiti kachasị mma nyejuo gị afọ.

15 na-ezipụ iwu ya nʼelu ụwa niile;

okwu ya na-agbasa ngwangwa.

16 na-atụsa snoo nʼala dịka ajị anụ,

na-efesasị igirigi snoo dịka ntụ.

17 na-atụdata mkpụrụ mmiri ya dị ka mkpụrụ okwute.

Onye pụrụ iguzogide oke ifufe oyi ya?

18 na-ezipụ okwu ya na-agbaze ha;

na-akpalịte ikuku ya mee ka mmiri bido ịsọgharị.

19 O kpugheela okwu ya nye Jekọb,

iwu ya na ụkpụrụ ya niile nye Izrel.

20 O mesobeghị mba ọzọ ụdị mmeso dị otu a.

Ha amakwaghị iwu ya niile.

Toonu Onyenwe anyị!

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-29_22-07-56-