Publicidade

Salmos 95

Toonu Onyenwe anyị

1 Bịanụ ka anyị jiri ọṅụ bụkuo Onyenwe anyị abụ;

ka anyị tikuo oke nkume nzọpụta anyị mkpu ọṅụ.

2 Ka anyị jiri ekele bịakwute ya

jirikwa iti egwu na ịbụ abụ jaa ya mma.

3 Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke dị ukwuu,

eze ukwuu kachasị chi niile elu.

4 Ebe niile michasịrị emi nke ụwa dị nʼaka ya,

ebe kachasị elu nke ugwu niile bụkwa nke ya.

5 Osimiri niile bụ nke ya, nʼihi na bụ ya kere ha,

aka ya kpụrụ ala akọrọ niile.

6 Bịanụ ka anyị kpọọ isiala nʼofufe,

ka anyị gbuo ikpere nʼala nʼihu Onyenwe anyị, onye kere anyị;

7 nʼihi na bụ Chineke anyị

anyị bụkwa ndị na-azụ dịka atụrụ,

igwe atụrụ na-elekọta anya.

Taa, bụrụ na unu anụ olu ya,

8 "Unu emela ka obi unu sie ike dịka unu mere na Meriba,

maọbụ dịka unu mere nʼụbọchị ahụ na Masa nʼime ọzara,

9 ebe nna nna unu ha nwara m,

nʼagbanyeghị na ha hụrụ ihe niile m mere.

10 Iri afọ anọ ka m were iwe megide ọgbọ ahụ;

ekwuru m sị, Ndị a bụ ndị obi ha na-akpafu akpafu site nʼebe m nọ,

ha amatabeghị ụzọ m niile.

11 Nʼihi nke a, aṅụrụ m iyi nʼiwe, sị,

Ha agaghị abanye nʼizuike m ma ọlị.’ "

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-29_22-07-56-