Publicidade

Páscoa

Por Bíblia Online

A Páscoa é a celebração suprema da redenção. Do cordeiro pascal no Egito ao Cordeiro de Deus que tira o pecado do mundo, ela aponta para o sacrifício e a vitória de Cristo.

A caminhada para a cruz

Jesus entrou em Jerusalém como Rei humilde, e a multidão o aclamou. Ele sabia do sofrimento que viria, mas caminhou em obediência até o fim.

Ụfọdụ nʼime igwe mmadụ ahụ nọ nʼihu, na ndị na-esokwa nʼazụ, nọ na-eti mkpu nʼoke olu na-asị:

"Hozanna dịrị Nwa Devid!"

"Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị!"

"Hozanna nʼebe kachasị ihe niile elu!"

O Onyenwe anyị, zọpụta anyị;

o Onyenwe anyị, mee ka ihe gaara anyị nke ọma.

Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị.

Anyị sitere nʼụlọ Onyenwe anyị na-agọzi gị.

Ṅụrịa ọṅụ nke ukwuu, gị Ada Zayọn!

Tie mkpu ọṅụ, gị Ada Jerusalem!

Nʼihi na lee, eze gị na-abịakwute gị,

onye ezi omume na onye nwere mmeri,

onye ewedara nʼala, nke na-anọkwasị nʼelu ịnyịnya ibu,

ọ bụladị nʼelu nwa ịnyịnya ibu, nwa ịnyịnya na-ebu ibu.

"Lee, anyị na-aga Jerusalem ebe a ga-arara Nwa nke Mmadụ nyefee nʼaka ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu. Ha ga-ama ya ikpe ọnwụ, nyefekwa ya nʼaka ndị mba ọzọ, ndị ga-eji ya mee ihe ọchị, pịa ya ihe, ma kpọgide ya nʼobe. Ma nʼụbọchị nke atọ, a ga-eme ka ọ site nʼọnwụ bilie."

A paixão de Cristo

Jesus foi zombado, açoitado e crucificado. Ele orou no Getsêmani e entregou sua vida voluntariamente, dizendo: 'Está consumado!'

Ha yipụrụ ya uwe ya, yinye ya uwe mwụda na-acha uhie uhie. Ha kpara okpueze nke e ji ogwu mee, kpukwasị ya nʼisi. Ha tinyekwara ya mkpara achara nʼaka nri, gbuo ikpere nʼala nʼihu ya, na-akwa ya emo na-asị, "Ekele, Eze ndị Juu!"

Nʼelu ebe isi ya dị, ka ha debere ihe ha dekwasịrị ebubo ha boro ya. Nke a bụ ihe ha dere:

Onye a bụ Jisọs, Eze ndị Juu.

O kwuru sị, "Abba, Nna, ị pụrụ ime ihe niile. Napụ m iko a, ma otu ọ dị, ọ bụghị ka e mee uche m, kama ka e mee uche gị."

Jisọs tiri mkpu nʼoke olu sị, "Nna, nʼaka gị ka m na-enyefe mmụọ m." Mgbe o kwusiri nke a, o kubiri ume.

Mgbe Jisọs detụrụ mmanya ahụ ọnụ, ọ sịrị, "Ọ gwụchaala." O hulatara isi ya, kubie ume.

A ressurreição gloriosa

Ele não está aqui — ressuscitou! O túmulo vazio é a prova de que a morte foi derrotada e Cristo vive para sempre.

Ma mmụọ ozi ahụ gwara ụmụ nwanyị ahụ sị ha, "Unu atụla egwu, nʼihi na amaara m na ọ bụ Jisọs onye a kpọgburu nʼelu obe ka unu na-achọ. Ọ nọkwaghị nʼebe a. O sitela nʼọnwụ bilie, dị ka o si kwuo. Bịanụ lee ebe ọ tọgbọburu.

Ma ọ sịrị ha, "Unu atụla egwu. Unu na-achọ Jisọs onye Nazaret a kpọgidere nʼobe. E meela ka o site nʼọnwụ bilie! Ọ nọkwaghị nʼebe a. Lee ebe e nibere ya.

Ọ nọkwaghị nʼebe a, o biliela nʼọnwụ, chetakwanụ ihe ọ gwara unu mgbe unu na ya nọ na Galili sị, ‘A ghaghị inyefe Nwa nke Mmadụ nʼaka ndị mmehie, a ga-akpọgidekwa ya nʼobe ma nʼụbọchị nke atọ ọ ga-esi nʼọnwụ bilie.’ "

Onye ọzọ ahụ nke na-eso ụzọ ya, onye nke buru ụzọ bịaruo nʼili banyekwara nʼime ili ahụ. Ọ hụrụ ma kwerekwa. (Ruo nʼoge a, ha aghọtabeghị site nʼakwụkwọ nsọ na ọ ghaghị i si nʼọnwụ bilie.)

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-22_10-02-25-