Gravidez e maternidade
Gravidez e maternidade são bênçãos celebradas na Bíblia. Deus forma cada criança no ventre, cuida da mãe e da família, e abençoa a geração dos justos.
Filhos são herança do Senhor
Deus abençoa a fertilidade e o crescimento das famílias. Cada criança é obra de suas mãos, conhecida e amada antes mesmo de nascer.
A ga-agọzi unu karịa mba ndị ọzọ niile dị nʼụwa. Ọ dịghị onye ọbụla nʼime unu, maọbụ nwoke maọbụ nwanyị ga-anọ na-amụtaghị nwa, ọ dịkwaghị anụ ụlọ unu ga-agba aka nwa.
Ma ihe gaara ụmụ ụmụ Izrel nke ọma, ha mụbara, dị ukwuu nʼọnụọgụgụ, jupụta ala ahụ niile.
Ụmụ ya ga-abụ ndị dị ike nʼala ahụ;
ọgbọ ndị na-eme ihe ziri ezi ga-abụ ndị a gọziri agọzi.
Ọ bụ gị kpụrụ akụkụ niile dị m nʼahụ.
Ọ bụkwa gị jikọtara ha niile ka ha bụrụ otu mmadụ nʼime afọ nne m.
Ana m eto gị nʼihi na abụ m onye e sitere nʼoke egwu na ebube kee;
ọrụ gị niile dị ebube;
amaara m nke a nke ọma.
Ụdịdị m abụghị ihe zoro ezo nʼebe ị nọ
mgbe a kpụrụ m nʼebe nzuzo ahụ,
mgbe a kpakọtara m nʼebe omimi nke ụwa.
Anya gị abụọ hụrụ ahụ m mgbe ọ na-enweghị ụdịdị ọbụla.
E dere ụbọchị niile a kwadoro m nʼime akwụkwọ gị
tupu otu nʼime ha adịrị.
Ụmụntakịrị bụ ihe nketa si nʼaka Onyenwe anyị,
ụmụntakịrị bụ ụgwọ ọrụ ọ na-enye.
Mụ onwe m, m ga-eme ka nwa rute nʼoge ọmụmụ
gharakwa ime ka a mụọ ya?"
ka Onyenwe anyị na-ekwu.
"M ga-emechi akpanwa
mgbe m na-eme ka a mụpụta ya?"
ka Chineke gị jụrụ.
Força e cuidado na gravidez
Deus dá forças à mulher grávida e a sustenta em cada etapa. Sua graça é suficiente e seu poder se aperfeiçoa na fraqueza.
Nʼihi na apụrụ m ime ihe niile site nʼinyeaka onye na-enye m ike.
Ma ọ sịrị m, "Amara m ezuorola gị. Nʼihi na ike m na-ezu oke nʼime adịghị ike." Ugbu a, obi dị m ụtọ ịnya isi banyere adịghị ike m. Nʼihi na ọ bụ site nʼọnọdụ adịghị ike m ka ike ebube Kraịst ga-esi nọgide nʼahụ m.
Tọọ ntị gị nʼala nụrụ olu m,
bịa ngwangwa gbapụta m;
ghọọrọ m oke nkume nke ebe mgbaba,
ebe mgbaba e wusiri ike maka nzọpụta m.
Ana m akpọku gị site na nsọtụ nke ụwa,
ana m akpọku gị mgbe obi m na-ada mba;
duru m gaa nʼoke nkume ahụ nke karịrị m elu.
Ọ ga-azụ igwe atụrụ ya dịka onye ọzụzụ atụrụ.
Ọ na-achịkọta ụmụ atụrụ.
Nʼaka ya abụọ ka ọ ga-ekuru ụmụ atụrụ nʼobi ya.
Ọ ga-eji nwayọọ duo ndị na-enye ụmụ ara.
"Geenụ m ntị, unu ụmụ ụmụ Jekọb,
unu ndị fọdụrụ nʼụlọ Izrel,
unu bụ ndị m na-elekọta siterị na mgbe a mụrụ unu
na-akpọgharịkwa unu siterị na mgbe amụpụtara unu.
Mụ onwe m, bụ onye ahụ, ọ bụ m ga-elekọtakwa unu anya,
ọ bụladị ruo mgbe isi awọ jupụtara unu nʼisi, nʼagadi unu.
Nʼihi na ọ bụ m kere unu, aga m elekọtakwa unu.
Aga m agba unu ume, bụrụkwa onye nzọpụta unu.
A bênção da maternidade
A Bíblia honra a maternidade como ministério sagrado. As mães são instrumentos de Deus para formar vidas e transmitir a fé.
Ma a ga-azọpụta ha site nʼọmụmụ nwa ma ọ bụrụ na ha anọgide na-ebi ndụ okwukwe na ịhụnanya, na ịdị nsọ, na nke uche zuruoke.
Ụmụ ya na-ebili gọzie ya;
otu a kwa di ya ga-eto ya ezi otuto.
Emesịa, Adam na nwunye ya Iiv dinakọrọ dịka di na nwunye. Iiv tụụrụ ime mụọ nwa nwoke, onye ha gụrụ Ken. Iiv sịrị, "Site nʼinyeaka Onyenwe anyị, amụtala m nwa nwoke!"
Onyenwe anyị jiri amara leta Sera dịka o kwuru na ọ ga-eme. Onyenwe anyị meere Sera ihe o kwere na nkwa. Sera tụụrụ ime, mụọra Ebraham nwa nwoke nʼoge o merela agadi. Ọ mụrụ ya nʼoge ahụ a kara aka Chineke kwere ya na nkwa.
Aịzik kpere ekpere rịọọ Onyenwe anyị ka o nye nwunye ya nwa nʼihi na ọ bụ nwanyị aga. Onyenwe anyị zara ekpere ya. Nwunye ya, Ribeka dịịrị ime.
Mgbe oge ruru, o mere ka Hana tụrụ ime, mụọ nwa nwoke. Ọ gụrụ ya Samuel, nʼihi na ọ sịrị, "Arịrịọ m Onyenwe anyị maka ya."
Proteção divina
Deus protege a mãe e o bebê, guardando-os de todo mal. Ele acompanha cada momento com ternura e fidelidade.
Onye ahụ na-ebi nʼebe mgbaba Onye kachasị ihe niile elu
ga-ezu ike nʼokpuru ndo Onye pụrụ ime ihe niile.
Nke a ka m ga-ekwu maka Onyenwe anyị, "Ọ bụ ebe mgbaba m na ebe nchebe m e wusiri ike,
Chineke m, onye m na-atụkwasị obi m."
Onyenwe anyị ga-edebe gị ka ihe ọjọọ ọbụla ghara ịdakwasị gị.
Ọ ga na-eche ndụ gị nche mgbe niile.
Onyenwe anyị ga-echebe gị mgbe ị na-apụ na mgbe ị na-abata abata,
site ugbu a ruo mgbe niile ebighị ebi.
"Amaara m gị tupu a tụrụ ime gị,
tupu a mụọ gị, edoro m gị nsọ,
ahọpụtakwara m gị dịka onye amụma nye mba niile."
"Ọ bụrụ na mmadụ abụọ esite nʼịlụ ọgụ ha merụọ nwanyị dị ime ahụ, mee ka ime ahụ pụọ, ma nwanyị ahụ emerụghị nnukwu ahụ, di nwanyị ahụ ga-anara site nʼaka onye ahụ merụrụ nwunye ya ahụ ihe niile ọbụla o kwuru na a ga-akwụ ya, bụkwa nke ndị na-ekpe ikpe kpebiri. Ma ọ bụrụ na nwanyị ahụ a nwụọ nʼihi mmerụ ahụ ahụ e merụrụ ya, a ga-eme ka nwoke ahụ merụrụ ya ahụ nwụọ.
"Nwanyị ọ pụrụ ichezọ nwa ya na-aṅụ ara,
hapụ inwe obi ebere nʼahụ nwa si nʼafọ ya?
Eleghị anya ọ pụrụ ichezọ,
ma agaghị m echezọ unu.
Esperança e promessa
A maternidade é caminho de esperança. Como Sara, Ana e Isabel, as mães encontram na fé a força para aguardar as promessas de Deus.
Site nʼokwukwe ọ natara ike ọmụmụ. Ọ bụ ezie na ọ gafeela oge ịmụta nwa, ọ bụladị Sera nʼonwe ya bụ nwanyị aga, nʼihi na ọ gụrụ onye ahụ kwere ya nkwa dị ka onye kwesiri ntụkwasị obi.
Ngọzị ga-adịrị onye ahụ kwere na Onyenwe anyị ga-emezu ihe o kweere ya na nkwa ime."
Ma Meri sịrị,
"Mkpụrụobi m na-ebuli Onyenwe anyị elu
mmụọ m na-aṅụrị ọṅụ nʼime Chineke bụ Onye nzọpụta m,
nʼihi na o ledatala anya, lekwasị m,
bụ odibo ya dị ala.
Site ugbu a gaa nʼihu, ọgbọ niile ga-akpọ m onye a gọziri agọzi.
Nʼihi na Onye dị ike emeelara m ihe dị ukwuu.
Aha ya dịkwa nsọ.
Ọ na-eme ka nwanyị aga biri nʼụlọ nke ya
dịka nne mụrụ ọtụtụ ụmụ ọṅụ juru obi.
Toonu Onyenwe anyị.
Aga m agọzi ya, sitekwa na ya nye gị nwa nwoke. Aga m agọzi ya ruo na ọ ga-abụ nne nke ọtụtụ mba. Ndị eze ga-achị ọtụtụ mmadụ ga-esite na ya pụta."
Nwunye gị ga-adị ka osisi vaịnị
na-amị mkpụrụ nʼime ụlọ gị;
ụmụ gị ndị ikom ga-adịkwa ka ome osisi oliv
gburugburu tebul gị.