36 Mgbe oge e ji achụ aja anyasị ruru, Ịlaịja, onye amụma bịara ebe ịchụ aja ahụ nso kpee ekpere sị, "O, Onyenwe anyị Chineke Ebraham, na Aịzik, na Izrel, biko gosi taa na ọ bụ gị onwe gị bụ naanị Chineke nʼIzrel, na mụ onwe m bụkwa ohu gị. Gosikwa na m bụ onyeozi gị, na ọ bụ ihe i nyere m nʼiwu ka m mere oge ndị a niile. 37 Biko, Onyenwe anyị m, zaa m ekpere m, zaa m ya, ka ndị Izrel niile mata na gị onwe gị, Onyenwe anyị bụ Chineke, na gị onwe gị na-atụgharịkwa obi ha ịlaghachikwute gị."