Ekpere Hana
1 Mgbe ahụ Hana kpere ekpere sị:
"Obi m na-aṅụrị ọṅụ nʼime Onyenwe anyị;
nʼime Onyenwe anyị ka e buliri mpi2:1 Nʼebe a, mpi na-akọwa maka ike m elu.
Ọnụ m na-anya isi megide ndị iro m,
nʼihi na-enwere m mmasị na nzọpụta gị.
2 "O nweghị onye dị nsọ dịka Onyenwe anyị;
o nweghị onye dị karịa gị,
o nweghị nkume ọzọ yiri Chineke anyị.
3 "Anọgidela na-ekwu okwu site na mpako,
ekwekwala ka ọnụ gị kwupụta okwu nganga.
Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke maara ihe niile,
ya bụ onye na-anwale ọrụ niile.
4 "Ụta ndị na-ebu agha agbajiela
ma ndị ahụ dara mba ka e nyere ike.
5 Ndị na-eriju afọ e meela onwe ha ndị ọrụ ngo maka nri,
ma ndị na-adịghị eriju afọ na mbụ aghọọla ndị agụụ adịghị agụkwa.
Nwanyị aga amụtala ụmụ asaa
ma nwanyị ahụ mụrụ ọtụtụ ụmụ adịghị amụtakwa.
6 "Onyenwe anyị na-eweta ọnwụ, ya na-emekwa ka a dị ndụ,
ọ bụ ya na-eme ka mmadụ daa nʼụra ọnwụ, na-emekwa ka ha dị ndụ ọzọ.
7 Onyenwe anyị na-ezite ụbịam na akụnụba;
ọ na-eweda nʼala, ma na-ebulikwa elu.
8 Ọ na-esite na ntụ welite onye ogbenye
na-ebuli ndị mkpa na-akpa site nʼikpo ntụ.
Ọ na-eme ka ha soro ụmụ eze nọdụ,
na-emekwa ka ha keta ocheeze nsọpụrụ.
"Nʼihi na ntọala ụwa bụ nke Onyenwe anyị
nʼelu ya ka ọ dọkwasịrị ụwa.
9 Ọ ga-echebe ụkwụ ndị nsọ ya
ma ndị ajọ omume ka ọ ga-eme ka ha dere duu nʼime ọchịchịrị.
"Ọ bụghị site nʼịdị ike ka mmeri si abịa.
10 Ndị ahụ na-ebuli onwe ha imegide Onyenwe anyị ka a ga-etipịa.
Onye kachasị ihe niile elu ga-ebigbọ site nʼeluigwe megide ha.
Onyenwe anyị ga-ekpe nsọtụ niile nke ụwa ikpe.
"Ọ ga-enye eze ya ike
bulikwaa ịdị ike2:10 Maọbụ, mpi nke onye ya e tere mmanụ."