Pular para o conteúdo
Publicidade

1 Samuel 2

Ekpere Hana

1 Mgbe ahụ Hana kpere ekpere sị:

"Obi m na-aṅụrị ọṅụ nʼime Onyenwe anyị;

nʼime Onyenwe anyị ka e buliri mpi2:1 Nʼebe a, mpi na-akọwa maka ike m elu.

Ọnụ m na-anya isi megide ndị iro m,

nʼihi na-enwere m mmasị na nzọpụta gị.

2 "O nweghị onye dị nsọ dịka Onyenwe anyị;

o nweghị onye dị karịa gị,

o nweghị nkume ọzọ yiri Chineke anyị.

3 "Anọgidela na-ekwu okwu site na mpako,

ekwekwala ka ọnụ gị kwupụta okwu nganga.

Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke maara ihe niile,

ya bụ onye na-anwale ọrụ niile.

4 "Ụta ndị na-ebu agha agbajiela

ma ndị ahụ dara mba ka e nyere ike.

5 Ndị na-eriju afọ e meela onwe ha ndị ọrụ ngo maka nri,

ma ndị na-adịghị eriju afọ na mbụ aghọọla ndị agụụ adịghị agụkwa.

Nwanyị aga amụtala ụmụ asaa

ma nwanyị ahụ mụrụ ọtụtụ ụmụ adịghị amụtakwa.

6 "Onyenwe anyị na-eweta ọnwụ, ya na-emekwa ka a dị ndụ,

bụ ya na-eme ka mmadụ daa nʼụra ọnwụ, na-emekwa ka ha dị ndụ ọzọ.

7 Onyenwe anyị na-ezite ụbịam na akụnụba;

na-eweda nʼala, ma na-ebulikwa elu.

8 na-esite na ntụ welite onye ogbenye

na-ebuli ndị mkpa na-akpa site nʼikpo ntụ.

na-eme ka ha soro ụmụ eze nọdụ,

na-emekwa ka ha keta ocheeze nsọpụrụ.

"Nʼihi na ntọala ụwa bụ nke Onyenwe anyị

nʼelu ya ka dọkwasịrị ụwa.

9 ga-echebe ụkwụ ndị nsọ ya

ma ndị ajọ omume ka ga-eme ka ha dere duu nʼime ọchịchịrị.

"bụghị site nʼịdị ike ka mmeri si abịa.

10 Ndị ahụ na-ebuli onwe ha imegide Onyenwe anyị ka a ga-etipịa.

Onye kachasị ihe niile elu ga-ebigbọ site nʼeluigwe megide ha.

Onyenwe anyị ga-ekpe nsọtụ niile nke ụwa ikpe.

"ga-enye eze ya ike

bulikwaa ịdị ike2:10 Maọbụ, mpi nke onye ya e tere mmanụ."

Veja também