23 Mgbe Abigel hụrụ Devid, o mere ngwangwa si nʼelu ịnyịnya ibu ya rịda, kpuo ihu nʼala, kpọọ isiala nye Devid. 24 Ọ dara nʼala nʼụkwụ ya, sị, "Ka ajọ omume ahụ dịkwasị nʼisi25:24 Gbaghara ịta ụta maọbụ ajọ omume nke ohu gị ohu gị, onyenwe m. Biko, kwere ka ohu gị gwa gị okwu, gekwaa ntị nʼihe ohu gị nwere ikwu.
Publicidade