Pular para o conteúdo
Publicidade

Amós 3

Ndị ama megide Izrel

1 Nụrụnụ okwu ndị a nke Onyenwe anyị kwuru megide unu, unu ndị Izrel, megidekwa ezinaụlọ ahụ niile nke m kpọpụtara site nʼala Ijipt.

2 "Naanị unu ka m họọrọ

nʼime ezinaụlọ niile nke nọ nʼelu ụwa;

bụ nʼihi nke a ka m ga-eji nye unu ahụhụ

nʼihi mmehie unu niile."

3 Mmadụ abụọ ga-esi aṅaa jekọọ ije

ma bụrụ na ha enweghị nkwekọrịta?

4 Ọdụm na-agbọ ụja nʼọhịa

ma bụrụ na o nweghị anụ hụrụ?

Nwa ọdụm na-ebigbọ nʼime olulu ya,

mgbe dịghị anụ dọgburu?

5 Nnụnụ na-ama nʼọnya dị nʼala

ma bụrụ na o nweghị ọnya e siri ijide ya?

Ọnya e siiri anụ na-akụchi

ma bụrụ na o nweghị ihe matara?

6 Mgbe a fụrụ opi nʼobodo,

bụ na ndị bi nʼime ya adịghị ama jijiji?

Mgbe mbibi na ịla nʼiyi dakwasịrị obodo ọbụla

bụghị Onyenwe anyị mere ka dị?

7 Nʼezie Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị adịghị eme ihe ọbụla

tutu ruo mgbe o buru ụzọ gosi ya

ndị na-ejere ya ozi bụ ndị amụma.

8 Ọdụm agbọọla ụja,

o nwere onye na-agaghị atụ egwu?

Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ekwuola okwu,

onye ga-ahapụ ibu amụma?

9 Kwusaanụ ya nʼobodo niile e wusiri ike nke Ashdọd

na ebe niile e wusiri ike nke Ijipt, sị,

"Zukọtanụ3:9 Maọbụ, Werenụ ọnọdụ unu nʼelu ugwu niile nke Sameria

ka unu hụ oke ọgbaaghara nke dị nʼetiti ya

na mmegbu niile nke dị nʼetiti ndị ya.3:9 A na-eme nʼime ya"

10 "Ha echezọọla ime ezi ihe." Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara,

"bụ ndị ahụ na-akpakọba ihe e zutere nʼohi na ihe e sitere nʼaka ike pụnara ndị mmadụ

nʼime nʼụlọ ha niile e wusiri ike."

11 Nʼihi ya nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru,

"Onye iro na-abịa! ga-agba ala gị gburugburu;

ga-akwatu ebe niile gị bụ nke e wusiri ike,

ma kwakọrọkwa ihe niile dị nʼụlọ gị ndị ahụ e wusiri ike."

12 Otu a ka Onyenwe anyị sịrị,

"Dịka onye ọzụzụ atụrụ si anapụta

naanị ọkpụkpụ ụkwụ abụọ maọbụ iberibe ntị site nʼọnụ ọdụm,

otu a ka a ga-esi zọpụta ụmụ Izrel bi na Sameria,

na nkuku isi ihe ndina3:12 Ndị na-edina nʼelu akwa dara oke ọnụahịa

na nʼiberibe akwa ọma site nʼelu ihe ndina.3:12 Ọ bụ nʼọnụ akụkụ ihe ndina na akwa ha"

13 "Nụrụ nke a, ma gbaanụ ama megide ụmụ Jekọb," bụ otu a ka Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, kwubiri.

14 "Nʼụbọchị ahụ, m ga-enye Izrel ahụhụ nʼihi mmehie ha,

aghaghị m imebikwa ebe ịchụ aja nke dị na Betel.

Mpi dị nʼebe ịchụ aja ka a ga-ebipụkwa,

mee ka ha daa nʼala.

15 Aga m etida ụlọ ndị niile ha wuru maka oge oyi,

na nke ha wuru maka oge okpomọkụ;

aga m ebibikwa ụlọ ndị ahụ niile ha ji ọdụ enyi wuo.

Ọtụtụ ebe obibi ha niile ka a ga-etitukwa."

Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.

Veja também