17 A sịkwarị na osisi fiig amaghị ifuru,
na ọ dịghị mkpụrụ dị nʼosisi vaịnị,
a sịkwa na mkpụrụ osisi oliv ebilata
na ala ubi niile emepụtaghị ihe oriri,
a sịkwa na ọ dịghị atụrụ dị nʼọgba anụ,
na ọ dịkwaghị ehi nọ nʼụlọ anụmanụ,
18 mụ onwe m ga-anọgide na-aṅụrị ọṅụ nʼime Onyenwe anyị.
Aga m etegharịkwa egwu ọṅụ nʼime Chineke Onye nzọpụta m.
19 Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị bụ ike m,
ọ na-eme ụkwụ m abụọ ka ha dịka nke ele.3:19 Ịdị ngwa nʼịgba ọsọ
Ọ na-emekwa ka m zọọ ije nʼebe niile dị elu.
Nke a dịrị onyeisi abụ, nʼụbọ akwara m dị iche iche.