31 Nʼihi na Onyenwe anyị adịghị ajụ onye ọbụla ruo
mgbe ebighị ebi.
32 Ọ bụ ezie na ọ na-eme ka mmekpa ahụ bịa, ma ọ na-emesịakwa gosi obi ebere ya,
nʼihi na ịhụnanya ya, nke na-adịghị agwụ agwụ, dị ukwuu.
33 Nʼihi na ọ naghị elezi anya eweta ahụhụ,
maọbụ mee ka ụmụ mmadụ nọọ na mmekpa ahụ.