Pular para o conteúdo
Publicidade

Marcos 11

Osisi fiig ahụ a kpọnwụọ

20 Nʼisi ụtụtụ echi ya, mgbe ha na-agafe, ha hụrụ na osisi fiig a esitela na mgbọrọgwụ ya kpọnwụọ. 21 Pita chetara ihe merenụ ma sị ya, "Onye ozizi, lee! Osisi fiig ahụ bụrụ ọnụ akpọnwụọla!"

22 Jisọs zara ha sị, "Nweenụ okwukwe nʼime Chineke. 23 Nʼezie agwa m unu, bụrụ na onye ọbụla asị ugwu a, Si nʼebe a wezuga onwe gị, gaa dabanye nʼoke osimiri,nke na-enweghị obi abụọ nʼime ya, kama o kweere na ihe o kwuru ga-emezu, ihe ahụ kwuru ga-emezukwa. 24 Ya mere, ka m gwa unu, ihe ọbụla unu rịọrọ nʼekpere, kwerenụ na unu anatala ya, ga-abụkwa nke unu. 25 Ma mgbe ọbụla unu guzoro na-ekpe ekpere, gbagharanụ, ma bụrụ na unu nwere ihe ọbụla megide onye ọbụla, ka Nna unu nke bi nʼeluigwe gbagharakwa unu mmehie unu.

Veja também